Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ngige na Oshiomhole ka na-ama aka ọgụ

Ngige na Oshiomhole ka na-ama aka ọgụ

Image copyright @LABOURMINNG

Chris Ngige bụ mịnịsta na-ahụ maka ọrụ aka na Naịjirịa agwala onyeisi otu paati APC bụ Adams Oshiomhole na ọ gaghị ewute ya chaachaa ma ọ bụrụ na ha kwụsị ya ọrụ ọ na-arụ n'APC n'ike.

Buhari na ndị omeiwu ukwu emeela ọgbakọ

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari na ndị omeiwu ukwu ndị ka nọ n'APC nwere ọgbakọ maka inyocha usoro ha ga-eji kwụsị ndị otu ha ịhapụ pati ha gawa ebe ọzọ.

Mgbe ha mechiri ọgbakọ a, ha gwara ndị ntaakụkọ na otu ha ka nwere ndị omeiwu kachasị n'ọnụọgụgụ n'ime ụlọomeiwu ukwu.

India na-akwadebe imepe ụlọọrụ 'Embaassy' 18 na Afirika

Image copyright Getty Images

Na mba ofesi, ala India ekwuola na ha ga-emepe ụlọọrụ nnọchịteanya nke bekee kpọrọ Embassy ruru iri na asatọ na mpaghara Afrịka.

N'aka ọzọ, a ka na-agụ akwụkwọ mbinyeaka nke ntụliaka mere n'ala Pakistan. Ugbua ọ dị ka Imran Khan bụbụ onye omee egwuregwu Kricket na-enwe mmeri.

Manchester United emiela AC Milan

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, otu Manchester United ejila penariti merie AC Milan n'asọmpi International Champions Cup n'ụtụtụ a.

Ha gbaburu otu ọkpụ otu ọkpụ tupu ha a banye penariti, ebe Man U ji ọkpụ itoolu asatara asatọ wee merie ha.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPatience Ozokwor nke mbụ