Rọchas: Tụọ aka ndị gbụrụ onyeisi APC Ideatọ, nweta nde N20

Rochas Okorocha Image copyright AFP

Ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ gbagburu Ejiagwu bụ aka na-achị otu pati All Peoples Congress (APC) n'okpuru ọchịchị ime obodo Ugwu Ideato nke dị n'Imo steeti n'abalị Tọọsde.

Mana Okorochaa ekwenla nkwa na gọọmentị ga-agba mbọ ịhụ na a nwụchị ndị kpara mkpamkpa ahụ.

N'okwu ya, Okorocha kwuru na etu e siri gbuo nwa amadị ahụ na-ewepụghị ihe ọbụla n'ụgbọala ya gosiri n'ọbịghị ndị ohi dịka etu enweghị ihe gosiri na ya na ha gbara mgba gosiri na ọ bụghị ntọ.

Okorocha onye kwuru nke a oge ndị ndorondoro ọchịchị nakwa ndị ndu si mpaghara ideato bịara ịgwa ya ihe mere sịrị: "Site n'ozi anyị nwetara, o doro anya na obighị ndị ojiegbeezu dịka o nweghị iihe a napụrụ ya maọbụ ihe gosiri na-a chọrọ ịtọrọ ya. Nke abụ gbagbu. ọnụ egbe ole a gbara ya gosiri na ọ bụ mgbagbu."

Image copyright Getty Images

Ndị obu egbe aga egbuola aka na-achị otu pati All Peoples Congress (APC) n'okpuru ọchịchị ime obodo Ugwu Ideato nke dị n'Imo steeti bụ Sunny Ejiagwu.

Ogueri Isiguzo bụ onyeisi APC n'Ugwu Owere gwara BBC Igbo na a gbabụrụ Ejiagwu n'abali ụnyaahụ ka o si nzukọ ala.

Isizugo sị na ogbugbu nwaamadị a nwereike metụta ndọrọndọrọ ọchịchị a nọ n'ime ya ugbua.

Eji 'Ohaneze' mara Ejiagwu bụ otu n'ime ndị isi APC ahopụtara n'ọchịchị ime obodo 27 e nwere n'Imo steeti na ntuiliaka ime ụlọ nke APC Imo steeti mere n'ụbọchị Monde nke izuụka a.

Ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru na onyeisi uweojii n'Imo steeti bụ Dasuki Galandanchi, gwara ha na eburula ozu Ejiagwu gawa ụlọozu dị nso ebe ihe a mere.

Ọ bụ n'okporoụzọ Akokwa nke Ugwu Ideato ka a kpara arụ a.

"E gburu onyeisi APC nke Ugwu Ideato. A gara m ebe ihe a mere lọta. E burula ozu ya gawa ụlọozu.

Anyị amabeghị ndị mere ihe a mana anyị na-eme nyocha. Ọbara ndị aka ha dị ọcha ga-agba ha n'anwụ," Galandanchi kwuru.

Na soshal midia, onye ahọpụtara ka onye mgbasaozi APC n'Imo ọhụrụ bụ Jones Onwuasoanya dere ozi APC zipụrụ maka ihe mere.

Isiguzo gwara BBC Igbo na a gbara Ejiagwu egbe ọtụtụ oge, ma kwuo na ogbugbu a nwereike site n'aka ndọrọrọdọrọ ọchịchị.

Cheta na APC n'Imo steeti nọ na nnukwu ọgbaghara kemgbe Gọvanọ Okorocha kwadoro ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-anọchi anya ya ma ọ rituo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a