Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Atletico etiela Arsenal mmonwu

Atletico Madrid akwatuola Unai Emery na International Champions

Aka gbajiri onye na-achịkọta otu Arsenal bụ Unai Emery n'asọmpi ya nke mbụ o du ha ga.

Atletico Madrid ji ọkpụ atọ a satara otu tie Arsenal mmonwu n'asọmpí International Champions na-eme ugbua.

Willie Obiano chụọla ndị ọrụ ya?

Mmadụ isii sọ na ndị isi oche ọchịchị ime obodo n'Anambra bụ ndị akụkọ kwuru na a sị ka ha kwara ngwonwgo ha laba maka aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano sị na ya chọrọ ndị ọhụrụ.

Mara na ndị nwere olileanya na ha ga-eso zọọ ndọrọndọrọ ọkwa ọzọ na ntuliaka a ga-eme na 2019, kwesiri iritu n'oche tupu ha bido njem ndọrọndọrọ.

Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa taa

Ọchịchịrị ga-ekpuchi ọnwa kpam kpam taa site n'elekere itoolu ruo iri na otu nke abalị taa.

Ọkammụta Augustine Ubachukwu bụ onyeisi 'Astronomy and Astrophysics Research Group' na mahadum Nsukka na-ezipu ozi nkea.

Nọt Koria ebunyela ndị Amerika ozu ndịagha ha

Onyeisiala Nọt Koria bụ Kim Jon Un, nyere Amerika ozu ndị agha Amerịka nwụrụ na agha Koria nke mere n'etiti afọ 1950 na 1953.

Onyeisiala Amerika bụ Donald Trump kelere Kim maka omume mana o kwuru na ndị agha ala ha karịrị puku isii ka na chọ n'ala Nọt Koria.

Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ,

BBC Nkeji

Lee ihe onyonyo anyị

Aha onyonyo,

Ndị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu