Akụkọ kachasị mkpa na mgbede a: Anyị ga-ewugharị SARS - Osinbajo

Ebe foto si, Yemi Osibanjo/Twitter
Osinbajo jiri ụgbọala laa ka ọ kagburu njem ya.
Osote onyeisiala mba Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo edepụtala akwụkwọ ozi kwuru na gọọmentị etiti ga-eme ihe niile dị n'ike ị kwụsị mkpa mkpa SARS na-akpa na Naịjirịa.
O kwuru ka ndị mmadụ nwee ndidi na n'oge adịghị anya, a ga-enwe ewughari SARS ọhụrụ dịka o kwesiri ị dị na mbụ.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari ezigarala ndị ide mmiri mebiri ihe na Kebbi steeti ozi itiakanobi.
O kwuru na ide mmiri a wutere ya ukwa n'ihi na o mebiri ubi rice ndi steeti ahụ kọchara.
Nke a na-abịa dịka ọ na-akwado ị ga njem mba Togo echi maka nzụkọ otu ECOWAS ga-eme n'isiobodo mba Togo bụ Lome.
N'akụkọ ofesi,

Ebe foto si, AFP
Archibishop Theorodre McCarrick bụbu fada na New York nakwa New Jersey
Pope Francis anabatala arụkwaghịm nke Theodore MaCarrick bụbu archibishop Washington degara ya n'abali Fraide.
Pope Francis agwala ya si ya "bie ndụ mwute na ekpere" ganye mgbe a ga-emecha nyocha ebubo eboro ya maka mmetọ ụmụaka.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Leicester City Official Twitter
Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ ka ha (ndị Leicester City) na Fleetwood sọrọmpi maka iko FA
Onye ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Kelechi Iheanacho esonyela ọzọ n'otu egwuregwu Leicester city nke mba Briten
O kwuru na obi dị ya ụtọ nakwa na ọ ga gba mbọ hụ Naịjirịa tozuru ikomba ụwa nke afọ 2022 n'abịa.
Gee nkeji nke mgbede a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile