Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Okechukwu sị Ndigbo tinye uche na ịnweta ọkwa onyeisiala 2023
Igbo ekwuzila maka ịhazịgharị obodo Naịjirịa

Ebe foto si, Osita Okechukw
Osita Okechukwu bụ onyeisi ndị Voice of Naịjirịa
Onyeisi ụlọ mgbasa ozi Voice of Naịjirịa bụ Osita Okechukwu gwara ndị Igbo Leaders of Thought ha tinye uche ha na inweta oche onyeisiala Naijirịa na 2023 karịa ikwu maka ịhazigharị obodo Naijirịa.
Okechukwu kwuru na ị kwadọ onyeisiala Muhammed Buharị ga-enye Ndigbo ohere ị nwete ya bụ oche onyeisiala na 2023.
Akụkọ maka Codiene apụtala ọzọ
ụmụ ntorobia na aṅụbiga ogwu codiene oke
Ministri na ahụ maka ahụike sị na ha ekpochapụla ọgwu ụkwara kodin ruru nde abụọ na ụma dị na ahịa na Naịjirịa.
Okammuta Isaac Adewole bụ minista ahụike na Naijịrịa kwuputara nke a n'Abuja mgbe otu ehibere maka nyocha mkpamkpa ya bụ ogwu na-akpa bịara ị kọrọ ya ihe ha chọpụtara.
Ọkụ na agba na Califonia
Ọkụ na-agba ọzara na Califonia, US
Ọ bụrụ na ndị nke gị nọ na Califonia mba US biko kpọọ ha jụọ ma ha apụtakwa n'ụtụtụ a maka oke ọkụ na-agba ọzara nke batara n'ala ahụ.
Ihe dịka mmadụ atọ anwụọla n'aka ya bụ oke ọkụ nke ajọ ikuku mere ka onwusiwa ike kemgbe ụnyahụ.
Egwu ahọọla Nemanja Matic
Ebe foto si, Getty Images
Nemanja Matic bụ onye serbia na-agbara Manchester United
N'egwuruegwu, Nemanja Matic bụ onye otu Manchester United agaghị eso gbaa bọlụ mbụ nke ndị otu ha na ndị Leicester city ga-akwata na mkpuru ụbọchị iri nke ọgọst.
A kana eleta Matic anya n'ụlọọgwụ maka ahụ o meruru mgbe ọ gbara iko mba ụwa.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị