Osita Okechukwu: Igbo wepụ uche na 'resturcturing'

Igbo na nhazigharị obodo Naịjirịa Image copyright Ebere Ekeopara
Nkenke aha onyonyo Ndịgbo na ndị agbụrụ ọzọ zukọrọ n'Awka ịkpa maka "restructuring"

Onyeisi ụlọ mgbasa ozi Voice of Nigeria (VON) bụ Osita Okechukwu ekwuola na ọ kaara ndị Igbo mma ịchọwa onyeisiala 2023 karịa ịkwuwe okwu ihazigharị obodo Naịjirịa.

N'okwu ya, ịchụwa ọkwa onyeisiala nke 2023 ka nso karịa ị chọwa ka a ga-esi hazigharịa obodo Naịjirịa.

O kwuru na ọ fọro naanị afọ anọ ka onyeisiala Buharị chizuo.

Okechukwu bụ onye otu APC kwukwara na ọbụrụ na Igbo kwado Buharị, Buharị akwado Igbo n'ịnweta ya bụ ebum n'obi nke pụtara na onye keele Sunny, Sunny ekeele ya.

N'aka nke ọzọ Okpani Nkama bụ otu n'ime ndị ọnụ na-erụ n'okwu n'Ohaneze Ndigbo sara Okechukwu na "ọ bụ uche ya ka ọ na-akọ".

N'okwu ya "uche onye adịghị ya njọ".

Ọkpanị kwuru na ihe Ohaneze na ọrụ na Igbo kpụ n'ọnụ bụ ka a ga-esị hazigharịa obodo Naịjirịa nke ga-enye aka ka egbe bere ugo bere.

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya agaghị ewetu onwe ya ala ịsawa Okechukwu okwu maka na ọ bụ ihe a tụrụ anya ka onye nọ na ọnọdụ ya kwuo ka a ghara ịchụ ya n'ọrụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnyeisiala Naịjirịa dị Igbo nso karịa 'restructuring'- Osita Okechukwu

Ọ rịọrọ BBC Igbo ka ha ghara ịkpọ aha ya maka na ọ achọghị itinye ọnụ na-ụdị okwu ahụ na-erijughị afọ.

Akụkọ ga-amsị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a