A kwụsịla ndị omeiwu APC na Benue ọrụ n'ike

Ndị omeiwu nọ n'otu pati PDP na Benue steeti akwụsịla ndị otu ha mmadụ asaa nọ APC ọrụ n'ike.

Ndị omeiwu PDP ahụ ruru mmadụ iri na itoolu na-akwụsị ndị otu ha ọrụ maka ime omume megide ụlọikpe na ime ọgbakọ megidere iwu.

Ndị PDP ahụ kwuru na ọgbakọ ndị APC mere megidere iwu maka na ha erubeghi isi nye mkpebi ụlọikpe nyere ka ha ghara ịga onye bụbụ onyeisi ha bụ Terkimbi Ikyange nso.

Ndị omeiwu PDP ahụ kpọkwara ndị otu mbaụwa ka gbata ọsọ enyemaka na nsogbu dị n'ụlọomeiwu Benue steeti ugbua.

Ndị omeiwu APC mere ọgbakọ taa ebe ha tiri iwu ka a chụtuo gọvanọ steeti ahụ bụ Samuel Ortom maka ebubo na o mefuru ego steeti n'ụzọ na-ekwesighi ekwesi.

N'ụtụtụ taa, ndị uweojii wakporo ụlọomewiu steeti ahụ na-ekweghi ka ndị omeiwu PDP mmadụ 22 banye.

Mana ndị otu pati PDP anabataghị nke a nke ọma ebe ha nọ n'akara ha na twitter na-eti mkpu maka ya bụ ihe ha kpọrọ mmerụaka.

Cheta na ụlọikpe nyere iwu n'izu gara aga ịkwụsị onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ Terkimbi Ikyange ka ọ ghara ịkpọzi onwe ya onyeisi ha.

Iwu ahụ metụtakwara osote onyeisi ahụ bụ James Okefe Ejembi na onye bụbu onye ndu ndị ka n'ọnụọgụgụ bụ Benjamin Tilley Adanyi.

Ọkaikpe steeti ahụ bụ Adam Onum kwuru ka ikpe ahụ digide rue oge a ga-ekpebi ikpe ndị ụlọomeiwu ahụ mmadụ asatọ gbara n'ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị