Okenze anọchiela Madumere n'Imo Steeti - Osuji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu gbasara nchụtu Madumere

Akụkọ na-efegharị ụgbua bụ na mmadu iri na itoolu ndị ụlọomeiwu Imo steeti achụtuola osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere.

BBC Igbo gbara onye ndụ ndị ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Lugard Osuji ajụjụọnụ, o kwuru na Onye nọchiri anya ya bụ Calistus Okenze bụ onyeisiọrụ n'Imo Steeti dịka Rochas zigara aha ya.

O kwuru na mmadụ iri na itoolu n'ime mmadụ iri atọ na asaa ndị ụlọomeiwu tinyere aka chụtuo ya.

Osuji gara n'ihu kwuo na nke a mere mgbe kọmitti ehiwere maka inyocha ya webatara akwụkwọ, ebe ha kwuru na Madumere abịaghị zara ọnụ ya n'ihu ndị kọmitii ahụ.

Osuji kwuru na ndị ụlọomeiwu enwetaghị akwụkwọ ọbụla si n'aka ụlọikpe Imo Steeti maka ịkwụsị usoro ichutu Madumere rue oge ha chuturu ya.

BBC kpọrọ onye ọzọ n'ụlọomeiwu Imo steeti n'ekwentị, o kwuru na nke a bụ eziokwu mana o kweghị akọwa usoro ha jiri mee nke a.

Image copyright Channels TV

Mana otu onyeisi ndị pati APC n'Imo steeti bụ Toe Ekechi gwara BBC na nke a bụ okwu asị.

O kwuru na ụlọikpe ukwu dị n'Imo steeti nke ọkaikpe Ben Iheka nọ n'isi ya gbochiri ndị kọmitii onyeisi ọkaikpe Imo steeti hiwere maka ichụtu ya rue abalị iri na atọ nke ọnwa Ọgọstụ.

Ekechi kwuru na "Ọ bụ ụfọdụ ndị ụlọomeiwu na gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha kpara nkata gwa ndị ụwa na achụpụla osote gọvanọ Imo steeti bụ Eze Madumere.

"Ọnweghi onye ma ebe ha nọ mee nzụkọ ịchụpụ ya n'ọkwa, onweghị mgbe ha kpọrọ Eze Madumere ka ọ bịa zara ọnụ ya tupu achụpụ ya".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a