Buhari chọrọ itu onye ụka alakụba zọrọ ndụ ndị otu Kraisti ugo

Nkenke aha onyonyo Imam a zoro ndị mmadu n'ime ụlọ ekpere ya, ma gwa ndị na-achụ ha na ha anoghị ebeanwa

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ya ga-etunye nwoke ahụ bụ onye nkuzi ụka alakụba zọrọ ndụ ndị otu ụka Krist ugo nke ala Naịjirịa.

Ọ bụ gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Simon Lalong bụ onye na-enye ozi a.

Dịka akụkọ siri kọọ, nwoke a aha ya bụ Abdullahi Abubakar dị afọ 83, zọrọ ndị otu uka Krist ruru otu narị, oge ndị na-achi ehi buru egbe bata ụlọekpere ya n'obodo Nghar, n'ime Barkin Ladi na Plateau steeti, na-achọ ndị ha ga-egbu.

Ha batara ụlọekpere ya na-ajụ maka ndị nọ na-ebe ahụ, mana Abubakar tụrụ ashị na ndị niile nọ na-ebe ahụ bụ ndị ụka alakụba, ndị ogbu ara ọbara a puru n'iro oge ha nụrụ nke a.

Na mkpa mkpa mere n'obodo ahụ n'ụbọchị ahụ bụ Juun 25, ha na-ebo ndị a na-achị ehi buru egbe ebubo na ha gburu mmadụ ruru narị atọ n'otu ụbọchị ahụ.

Lalong kwuru na Buharị ga-aturu Abdullahi Abubakar ugo nke ndị bekee kpọrọ 'National Honours'.

Abubakar gwara ndị nta akụkọ na ya zoro ndị ụmụnwanyị na bee ya, ma kwa zoo ndị ụmụnwoke na ụlọekpere ya.

Abubakar kwuru na gọọmentị ya kana akwadebe ihe ha ga-enye Abubakar maka agwa iribaama a ọ kpara.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a