Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ekweremadụ sị na ya ahusiele anya n'ọchịchị a

Ekweremadu sị na ya ahusiela anya na gọọmenti a

Ekweremadu na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị

Ike Ekweremmadụ

Ebe foto si, @ike_Ekweremadu

Nkọwa foto,

Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị

Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekeremadu agụpụtala ugboro ole na ole a nwalere ịchụpụ ya n'ọkwa.

Ekweremadụ kwuputara nke a mgbe Achịbishọp ụka Anglịkan n'Enugwu bụ Emmanuel Chukwuma gara iti ya aka n'obi maka ọnwụnwa niile ọ na-agabiga.

Buhari chọrọ itunye Ịmam zọrọ ndị otu Kraisti narị atọ na Platu steeti ugo

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Buhari ahusiela anya n'aka ndị mgbuisi na Naịjirịa

Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọla oku ka akpọtara ya Abdulahi Abubakar bụ maka nturuugo ala Naịjirịa.

Abubakar bụ Ịmam ahụ zọpụtara ọtụ ndị otu kraistị narị atọ mgbe ndị Fulani na-achi ehi na-egbu mmadụ na Barkin Ladi, Platue steeti Ịmam zọrọ ndị otu Kraisti narị atọ na Platu steeti na ọgbaghatara mere nso nso.

EFCC na-ebo Ortom ebubo nrụrụaka

EFCC na gọvanọ Ortom

Ebe foto si, EFFC/TWITTER

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n'ụlọikpe n'aka EFCC

Ụnụ ahụla e, Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka bụ EFCC ebola Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue steeti ebubo imefu ego ruru ijeri iri abụọ na abụọ.

Ha na-ebokwa mmadụ iri abụọ na otu ndị ọzọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ ebubo nde kwuru nde asị na ha mefuru.

Nọt Korịa ebidola ọzọ?

Nọt Korịa na Amerika
Nkọwa foto,

Nọt Korịa na Amerika kwekọrịtara ịmebị ikeke nulịa ha ma kwụsịkwa irụ ọzọ

Akụkọ na-akọ na ọ dịkwa ka mba Nọt Koria ka na-aga n'ihu ịrụpụta ogbunigwe nuklịa

agbanyeghị aka niile Amerika dọrọ ha na nti.

Onye ọrụ mba US akpọghị aha ya gwara Washington Post na mgbama 'Satelite' mba US nyopuru nke a.

N'egwuruegwu,Onoriode Ehwarieme sị naọgụ na-agụ ya

Okpo mbaụwa

Ebe foto si, Onoriode Ehwarieme/Fb

Nkọwa foto,

Onoriode Ehwarieme chọrọ ịnụsa Anthony Joshua bụ onye ji nturu ụgọ atọ nke mbaụwa ma jirikwa ọla edo olympic nke 2012 bụ nke o meriri na aha Briten.

Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Nsọala n'obodo ụfọdụ n'Igbo