A nwụchiela nwoke tụnyere nwa ya ime ma jụ na ọ gaghị alụ di

Onye a na-ebo ebubo Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye a na-ebo ebubo

Aka ndị uweojii akparala nwoke metọrọ nwa ya nwayọọ afọ asatọ kemgbe nwunye ya nwụrụ ma tụnye ya ime, nwa dị afọ atọ ugbua.

Julius Ochim onye Krọs Riva bi na Shagamụ bidoro metọwa nwa ya nwaanyị ka ọ dị afọ 13 n'afọ 2009 ka nwunye ya nwụchara rute oge ọ tụwara nwa ya ime ka ọ dị afọ 18.

O buru afọ ime ahụ mụọ ya afọ atọ gara aga.

Nwata nwaanyị ahụ boro ebubo na nna ya na-eji omenala emewa ya kwa ya ihe ga-eme ya ma ọ bụrụ na ọ jụ idina ya.

Mana nsogbu dapụtara ka otu nwoke gosiri mmasị ya ịnụ nwa ya ahụ dịzị afọ 21.

Ochim gbara isi akwara, na-aba, na egbu mma n'ala na ọ gaghị eme.

Arịrịọ niile ndị metụtara ha rịọrọ nwoke a ka o nye ohere ka nwa ya lụọ di dịka ịgbasa mmiri n'okwute.

Nke a mere ka nwa ya ga kpesara ndị uwe ojii n'ogige nke Shagamu.

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ogun steeti ebe mkpamkpa kpara bụ Abimbola Oyeyemi, kwuru na anwụchiri nwooke ahụ ka nwa ya wetachara mkpesa na nna ya na emetọọ ya kemgbe afọ 2009 nne ya jiri nwụọ. Ya tụrụ ime,mụta nwa dị afọ atọ ugbua.

Ọ gara n'ihu kwuo na Ochim kwetere n'ebubo eboro ya bụ eziokwu ma sị na ọ bụ ọrụ ekwensu.

O kwukwara na ihe kpatara ya ji jụ ka nwa ya lụọ dị bụ ya ya nwe ohere ga n'ihu idina ya.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kachiri ya ganye oge ha ga-emecha nyocha ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị