Lee nwata nwoke ji ọkụ nkịtị achụsa Ọdụm n'ọhịa

Richard Turere na efi ya
Nkenke aha onyonyo Richard Turere bụ nwata oge ọ mụpụtara usoro ọ ga-eji zọpụta efi ya n'aka ọdụm

"A hụrụ m ọdụm n'anya, ahụbeghị m ihe mere agaghị m ahụ ha n'anya."

"Ọ bụrụ na o nweghị ihe na-egbu ehi nakwa na o nweghị ihe ga-eme ha, anyị na Ọdụm ga-ebi n'udo.

Ụdị okwu a gbagwojuru anya maka na o si n'ọnụ onye na-echekwa ehi na mba Kenya.

N'ihi na ọrụ ha bụ iji ihe ọbụla rutere ha aka were chekwa ehi ha. Mana otu nwata dị afọ 18 abụghị onye nchekwa nkịtị.

Oge o ruru afọ 11, ọ mepụtara ọkụ nke Bekee kpọrọ 'solar light' na-achụsa ọdụm chọrọ ịtagbu ehi n'ime ụlọanụ.

Oge ahụ ọdụm na-atagbu ehi ruru itoolu n'otu izuụka.

A na-ere ehi otu puku dọla.

Nne Richard bụ Veronica kwuru na "Ọdụm na-atagbu ehi anyị oge ọbụla mana oge o mepụtara ọkụ a, anyị enweghịkwa nsogbu a ọzọ"

Nkenke aha onyonyo Ọdụm atagbuola ọtụtụ efi n'obodo ahụ

O were ya ọtụtụ oge tupu o mepụta ọkụ a nke ọma. Oge o bidoro, o mepụtara osisi na-eyi anụmanụ egwu tupu ọ rụọ ụlọ ehi jiri ezigbo ojii nke bụ na ọdụm anaghị ahụ ime ụlọ a anya, mana ọdụm na-anụ isi ya bụ ehi.

Mana otu abalị Richard jiri ọkụ agagharị, n'abalị ahụ o nweghị ọdụm ọbụla biara ịtagbụ ehi ya.

Nkuzi emume a

Richard kwuru na: "Ọ bụ oge m na-akwasa ihe ka m mụtara maka igwe electrọniks"

Ọkụ a Richard mepụtara eruola aka ndị mmadụ 750 n'obodo ya.

Nkenke aha onyonyo Richard na-edozi ọkụ dị iche iche oge ọbụla

"O nwere oge ha na-akpọ m ka m doziri ha ọkụ ha maka na ha amaghị ka ọ sị arụ ọrụ."

Richard na-ere ọkụ ya nari dọla 200. Ọkụ dị iche iche ruru 15 bụ ihe na-ekpute na ya.

Ụlọakụ Ehi

Obodo Richard dị n'etiti Nairobi National Park dị na Kitengela. Ọ bụ obere osimmiri kewara obodo ya na ebe a anụmanụ na-ebi.

Abalị ọbụla anụmanụ dị iche iche na-agbafe ala ya, ọdụm na-esokwa ha.

Nkenke aha onyonyo Ọkụ Richard mụpụtara eruola ala dị iche iche

Otu ụkọchukwu aha ya bụ Calvin Tapaya kọwara na "Ọdụm na-enye nnukwu nsogbu n'ebe a. Ọ dị ha mfe ịtagbu ehi n'abalị. Mana cheta na ehi bụ ụlọakụ anyị."

Na agbanyeghị na o nweghị ego ọbụla gọọmentị nyere ya, Richard were nkwenye na ọkụ na-akwadọ ọrụ nke ndị na-achịkọta anụmaanụ n'ala ahụ nke a kpọrọ 'Kenyan Wildlife Service' na Bekee.

Otu kwuru na ọdụm ruru otu narị na-anwụ n'afọ ọbula, ugbua sọọsọ 1,700 nọrọ n'ọhịa ala ha.

Mmegharị

Ọ bụ ndị mmadụ na-egbu ọtụtụ ọdụm.

N'afọ 2012, ha gburu ọdụm isi. Abụọ n'ime ha toro eto. Ha gburu ha maka ha batara otu obodo na Kitengela. Ọkụ Richard ga-echekwa ọdụm biri na mpaghara bee ya na kwa efi biri na obodo ya.

Nkenke aha onyonyo Richard na-eji igwe electronic na-amụta ihe gbasara ọkụ

N'afọ 2014, gọọmentị Kenya mepụtara iwu ga-enye ndị nsogbu mmadụ na anụmanụ metụtara nke ọjọọ ego iti aka n'obi.

Mana ihe na-eme n'ezie bụ na ọ bụghị oge ọbụla ka ha na-agwụ ụgwọ a.

Akụkọ BBC nke a kpọrọ BBC Innovators series na-amụpụta ohere idoziri ọtụtụ ihe.

Mmụta maka akụkọ a n'ebe a BBC Innovators.

Ọkụ a Richard mepụtara agbanweela ndụ ya - ọ ga-aga otu nnukwu ụlọakwụkwọ dị na Nairobi n'efu dịka onye nwe Alibaba bụ Jack Ma kpọrọla ya oku.

Ha na-akpọ ya 'nwata ọkụ ọdụm n'ala dị iche iche dịka Argentina na India.

Nkenke aha onyonyo Richard Turere chọrọ ka ewu ya dị ndụ

Richard na-ekwusi ike na ọ dị n'aka gọọmentị ka ha kwado ndị na-emepụta ihe dịka ya n'ala Kenya.

Onye tinyere aka n'akụkọ a bụ Sheila Kimani.

Ọ bụ Bill na Melinda Gates Foundation mepụtara akụkọ a.