Akụkọ kachasị na mgbede a: Ọchịchị abaala APC isi - Ohaneze

Ebe foto si, @ike_Ekweremadu
Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị
Ohananeze Ndịgbo akatọla njide gọọmenti jidere osote onyeisi Sineti bụ Ike Ekeremadụ.
Ode akwụkwọ mgbasa zi otu a bụ Uche Achi-Okpaga sị na ha bụ ijiji aghọrọla isi membi dịka ọchịchị sịrị baa gọọment APC n'isi.
Okporo gas ga aga n'Abia steeti

Ebe foto si, Getty Images
Shell na-emepụta 39% mmanu agbidi na Naịjirịa
Ndị ọrụ shell nke Naịjịrịa ekwuputela ebumnobi ha ịrụ okporo mmanụ gas n'ebe ụfọdụ n'Abịa steeti.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Ed Ubong kwuru na a ga-arụ ụzọụgbọ ga-agafe Osisoma, Ogbo Hill nakwa Ariaria maka nke a.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ịhụ gọvanọr steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu.
Otu BBOG enwetala nkatọ

BBOG na-akwanye gọmenti ọkụ ka ha chọta ụmụ akwụkwọ Chibok kemgbe 2014
Otu Coalition Against Terrorism and Extremism akatọla okwu ndị isi na-akwanye gọọment ọkụ ka ha kpọchite ụmụnwaanyị Chibok furu efu bụ Oby Ezekwesili na Aisha Yesufu.
Akụkọ kọrọ n'Ezekwesili na Yusufu boro ndị agha Naịjirịa na ha na-eli ndị otu ha ndị Boko Haram gburu na nzuzo.
Ntuliaka Zimbabwe

Ebe foto si, Reuters
Akwụkwọ na-egosi na Zanu-PF na-emeri nduliaka Zimbabwe
Ọgụ adaalanụ na ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị Zimbabwe ka otu pati MDC Allaince na-ebo pati Zanu-PF ebubo ịme nrụrụaka.
Ka ọ dị ugbua, otu onye nọ n'ọzụ maka nke a.
N'egwuruegwu, ndị AAC tọrọ na Legọs

African Athletic Championship bidoro na Asaba tata
N'egwuruegwu, ndị egwuruegwu na a ga-asọmpi African Championship tọrọ na ọdọụgbọelụ Lagọs eruola Asaba n'ụtụtụ tata.
Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra.