Zimbabwe election: Emmerson Mnangagwa ejirila obere ihe gafee

Emmerson Mnangagwa Image copyright AFP/Getty
Nkenke aha onyonyo Mnangagwa nwetere ihe karị pacenti 50 n'ime vootu atụrụ

Onyeisisala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa meriri ntuliaka eji họpụta, ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru.

A gụọla vootu mpaghara iri, nke gosiri na Mnangagwa nwetere pacenti 50 n'ime vootu atụrụ ka Nelson Chamisa nke pati na-anọghị n'ọchịchị bụ MDC nwetere percent 44..

Mana, ndị MDC ekweghị n'ihe ngalaba ntuliaka Zimbawe kwuru, nke mere ndị uweojii ji kpọpụ ha n'ebe a na-agụ vootụ ahụ.

Onyeisis MDC sị na vootu ahụ agụpụtara ezighi ezi.

Mnangagwa kele ndị nkwado ya na Twitter ma kwuo na mmeri ya bụ "mmalite ọhụrụ".

Chamisa na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri ntuliaka a, nke mere oji gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tusde na ZANU-PF chọrọ "ịghọ aghụghọ", bụ ihe ha "agaghi ekwe ka ome".

Mana ngalaba Zimbabwe Electorial Commission (Zec) sị onweghi nrụrụ aka ọbula emere.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị nkwado Mnangagwa na-enwe aṅụrị

Mmadụ isi nwụrụ mgbe ndị na-akwado MDC mere ngaghari iwe n'ụbọchị Wenesde.

Ntuliaka bụ nke mbụ Zimbabwe na-eme kemgbe Robert Mugabe pụrụ n'ọchịchị n'ọnwa Novemba nke afọ 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a