Akụkọ kachasị na mgbede a: Idemmiri emebiala ụzọ Igbo

Ide mmiri Image copyright Stephen Mbong
Nkenke aha onyonyo Okporo ụzọ MCC, Urata n'ime Owere

Ndị Mịnịstri na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti, otu ndị gbatagbata gọọmenti etiti (NEMA) na nke steeti (SEMA) gara njem nleta n'Awka, Onicha na ebe ndị ọzọ ide mmiri mebiri ụzọ

na steeti ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Michael Okonkwo gwara ndị ntaakụkọ nke a mgbe ha gara ileta mkpamkpa ide mmiri kpara n' Ezi Mgbemena nke dị na Ọnịcha.

Ndị gbaara ọsọ pati enwela nzuko mbu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị APC agbafela PDP

Ndị isi ọchịchị ụlọomeiwu nakwa nke steeti si pati APC wụfee PDP agaala ọgbakọ ndị isi ọchịchị PDP nke mbụ ha kemgbe ha wụfere.

Ndị ọchịchị a gụnyere Bukola Saraki, Rabiu Kwankwaso, Aminu Tambuwal, Samuel Ortom nakwa ndị ọzọ.

Popu si onye egbula ibe ya ọzọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Popu Fransis wetere ọtụtụ mgbanwe na ụka katọlik

Pope Francis bụ onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile agbanwela nkuzi ndị ụka ahụ ka o megide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghị ihe ọbụla onye ahụ mere.

O kwuru na ụka Kraịst niile ga-agba mbọ ịhụ na akachapụrụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ na mbaụwa niile.

N'egwuruegwu,NFF ekwetala ka ha na Giwa kpee udo

Image copyright NFF/Fb
Nkenke aha onyonyo Ọchịchị Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF ga-abịa n'isi njedebe na Sept. 30

N'iji gboo nsogbu dị n'etiti ha, otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF adịla njikere ibuli mmachi amachiri onye otu ha bụ Chris Giwa.

Ha kwuru na nke a ga-adị ire ma ọ bụrụ na Giwa gbahapụ mkpọpụ ọkpọpụrụ NFF n'ụlọikpe.

Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịko taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPeter Obi siri Ndigbo teta n'ụra.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a