Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Madumere ọ gbazi aka ndị nchekwa?

Akụkọ ndị dị mkpa

Image copyright @GarShehu
Nkenke aha onyonyo Garba Shehu

Onye na-ekwuchite ọnụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ndị otu PDP na-ekwu na Buhari gara njem ka ndị otu ya nwe ohere ị megide iwu ala bụ asị.

Garba Shehu si n'akara soshal midia ya kwuo n'ebe Buhari nyere osote ya ikikere ịchị, o gosiri na ọ bụ onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya.

Image copyright Channels TV

Ụfọdụ akwụkwọ ntaakụkọ na-ekwu na ndịuweojii eweghachila ndị na-eche Eze Madumere bụbu osote gọvanọ n'Imo steeti.

Ha kwuru na Madumere si n'ọnụ onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Uche Onwuchekwa were tiputa mkpu a.

Na mba ofesi,

Image copyright AFP/Getty
Nkenke aha onyonyo Mnangagwa nwetere ihe karị pacenti 50 n'ime vootu atụrụ

Emmerson Mnangagwa nke otu ndọrọndọrọ Zanu PF emeriela ntuliaka emere na mba Zimbabwe.

Zanu PF nwetakwara ụzọ abụọ n'ụzọ atọ n'ụlọomeiwu mba Zimbabwe na ntuliaka ahu tara isi mmadụ isii.

N'egwuregwu,

Nkenke aha onyonyo Ha na-ebe akwa na uhere adịghị ịkwadebe nke ọma maka asọmpi a

N'asọmpị Afrịka Senior Athletics na-eme n'asaba ugbua, a na-anụ kepu kepu na Blessing Okagbare nke Naijiria apụọla n'asọmpị ahụ

Enekwechi Chukwuebuka meiriri na shotput, ebe Oluwatobiloba Amusan ritere olaedo n'ọsọ ụmụnwaanyị nke '100m'.

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.