Saraki: Ndị na-akwado APC na PDP etinyeela ọnụ na nsogbu a

Bukola Saraki Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Saraki meriri EFCC n'ụlọikpe kachasị n'ọnwa Juli maka ebubo mpu na nruru aka

Akụkọ nke mere ọhụrụ n'etiti ndọrọndọro ọchịchị Naijiria ụnyaahụ bụ na otu Peoples Democratic Party (PDP) ahọpụtala onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki dịka onyeisi ha.

Mana ụnyaahụ, akụkọ kwuru na PDP ziri ozi ka ndị omeiwu ha niile laghachite Abuja, maka ha na-eche na APC nwere ike ijiri ike mepe ụlọomeiwu wee chutuo Saraki na Ekweremadu.

BBC Igbo gbara ndị otu APC na PDC ajụjụọnụ maka ebumnuche ha gbasara ihe a na-eme ugbua n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa.

Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuchiri otu APC na Legos steeti gwara onye ntaakụkọ anyị na nsogbu PDP bụ na obi na-amapụ ha maka njọ niile ha mere n'ala Naịjirịa.

N'ọnụ okwu ya,"Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari abụghị onye na-eji njọ akwụghachị njọ. PDP na-ama jiji maka na obi ha na-apịa ha ụtarị maka mpu na aghụghọ niile mere n'oge ọchichị ha."

Igbokwe kwusiri ike na ọ bụ ikike ndị Sineit ịhọpụta ndị ha chọrọ ka ha chịa ha.

"Ọ bụrụ na ha chọrọ ịchụda Bukola Saraki, o nweghị njọ dị na ya."

Mana Austin Umehi bụ otu n'ime ndị welitere isi na PDP kwuru na APC agaghị anwa anwa ịchụda Bukola Saraki.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo PDP na-ebo na aka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari nọrọ na nsogbu a

O kwuru na: "Ụlọomeiwu nwere iwu ha na-eso. Ihe a pụtara na ndị otu APC agaghị eteta n'ụra otu ụbọchị, chụda mmadụ dịka Bukola Saraki."

O kwukwara na o nweghị egwu dị n'obi Saraki maka ya, nakwa na ndị ụlọomeiwu na-eche echiche a na-egbu oge ha.

Etu ọ dị ugbua

PDP sị na Saraki bụ onye otu ha kachasị elu n'ọkwa ọchịchị n'ala Naịjirịa, nke mere ha jiri tunye ya ugo a.

Dịka o siri dị ugbua, nke ga-abụ mbụ pati na anọghị n'ọchịchị, maọbụ nwekarịa ndị omeiwu, ga-achi ụlọomeiwu na Naịjirịa.

Mana, a mabeghị ma ọnọdụ a ọ ka ga-adị etu a, maka na n'ụbọchị 24 nke ọnwa APC wepụtara aha ndị omeiwu 52 ha si bụ ndi otu ha, nke nyere ha nkarị n'ụlọomeiwu.

Ya bụrụ na nke a bụ eziokwu (o nwebeghị ndị n'ime ndị a gọnahụru edemede a) APC nwere ọnụgụgụ a ga-eji chụtuo Saraki ma ndị omeiwu laghachite ezumike.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ekweremadu ka-aza ajụjụ n'aka ndị EFCC

Nke mekwara ụfọdụ ndị omeiwu nke obele jiri nọdụ n'ụlọomeiwu ụnyaahụ.

Akụkọ kwukwara na ndị sinetọ otu PDP ga-enwe ọgbakọ ebe ha ga-eche ihe a ga-eme ma ọbụrụ na APC mere udi ihe a.

Ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ Sun dere na ndị Sinetọ gara njem n'ala Bekee ga-alaghachị azụ taa maọbụ echi.

Chukwuka Onyema bụ osote onyeisi otu PDP n'ụlọ omeiwu obele gwara ndị ntaakụkọ na ha nụrụ akụkọ ndị sinetọ otu APC ga-emee ọgbakọ na nzuzo ịchụda Bukola Saraki.

PDP na-ebokwa na njem Buhari gara ala Briten bu maka inyere ndị sinetọ APC ohere ịchụda Bukola Saraki.

Asị, asị!

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naịjịria bụ Garba Shehu bụ na-ebubo nke a gbasara Buhari bụ asị na-atọ ọchị maka na o nweghị onye ọbụla na Naịjirịa ga-ekwenye n'ihe ọbụla PDP ga-ekwu ọzọ n'ala a.

Akukọ ga-amasi gị