Ụmụnwoke, sepụnụ ọnụ n'ara ụmụnwaanyị - Mịnịsta Ahụike

Nwa na-aṅụ ara Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Dịka ndị ọkammụta ahuike siri kọwa, ara bụ ezi nri na-eme ka ụbụrụ ụmụaka na-acha ọkụ

Mịnịsta Naịjirịa na-ahụ maka ahụike bụ Ọkammụta Isaac Adewole arịọọla ụmụnwoke ka ha kwado nwunye ha n'inye nwaọhụrụ ha ara nke ọma, "hapụ ị na-azọsara nwa ha ara."

Mana ndị ọrụ ahụike na-ekwu na ma nna ma nwa nwere oke n'ara nwaanyị.

Adewole kwuru okwu a n'emume mbido izu inye nwa ara nke afọ a kpọrọ 'World Breastfeeding Week' na bekee nke e mere n'Abuja ụnyaahụ.

Ụbọchị Ọgọstụ 1-7 bụ izu e ji eme mgbasa ozi maka mkpa inye nwa ara dị n'ụwa niile.

O kwuru ka ụmụnwoke nye ụmụnwaanyị ohere inye nwa ara.

N'okwu ya; "Inye nwa ara bụ ịkpakọba akụ maka ụbụrụ na ọganihu ala anyị."

"Ka anyị jikọta aka ọnụ kwado ya. Ụmụnwoke, bikonụ, nyenụ ụmụnwaanyị ohere inye nwa ara. Azọsala nwa ụnụ ara."

Image copyright Getty Images

Adewole gara n'ihu sị, "Kwado ya. Ụmụnwaanyị, ama m na ụnụ hụrụ anyị n'anya mana enyela anyị, nye ụmụ ụnụ.

"Ọ bụrụ na anyị nye nwaọhụrụ ezigbo nri, anyị ga-enwe, anyị ga-enwe ezi ndịọrụ nakwa ezi ndu na ọdịnihu."

Dịka otu mbaụwa na-ahụ maka ụmụaka a kpọrọ Unicef siri kwuo, ara na-enye nwaọhụrụ akụrụngwa ahụ niile dị mkpa maka ezi otito n'ọnwa isii mbụ ya.

Mana otu onye ọrụ ahụike aha ya bụ Chịka Obika na ma nwoke,ma nwa ya nwe ara.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ma nwoke ma nwa ya nwe ara'

"Ọ bụ dị na nwa nwe ara. Inye dị ara na-enye aka ka agbafe ọrịa akpụ kansa ara. Inye nwa ara na-achụte ọrịa n'ụmụaka aka. Mee ka ha too ọfụma."

Mana Obika kọwara na ihe niile ndị a nwere oge ya; nwata na-aṅụ ara otu afọ, ebe nwoke nwekwara ike iweghaziri ya ma nwa ṅụcha.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a