Kedụ ka ndị Igbo ga-esi na-azọ Eze ndị Igbo n'ala ọzọ?

Ndị nze na ọzọ Image copyright Amarachi Atama

Otu ụlọikpe na Kano agwala Eze Ndigbo Kano bụ Boniface Ibekwe ka ọ kwụsị ibugharị onwe ya dịka ezigbo Eze Ndigbo na steeti ahụ rue mgbe a ga-ekpebi ikpe gbasara ya.

N'akwụkwọ ikpe Ezedioramma nke ise na Kano steeti bụ Ikechukwu Akpudo gbara n'ụlọikpe ahụ, ọ na-achọ ka Ibekwe na ndị otu ya kwụsị ịkpọ onwe ya Eze Ndigbo na Kano n'okpuru otu Igbo Community Association (ICA) n'aha ịchafụ.

Iwu ụlọikpe ahụ kwukwara ka Ibekwe kwụsị ibugharị maọbụ ibupu onyinye maọbụ ihe ọbụla nke otu ICA Kano nwee nke gụnyere ala, ụlọ, ụlọahịa na ngwongwo ndị ọzọ.

A ga-ekpe ikpe ahụ n'ọnwa Sepụtemba.

Mana nke a abụghị mbụ ndị Igbo na-azọ eze na mba ọzọ nke mere na ọtụtụ ndị Igbo akpọọla oku ka a kwụsị ichi echichi eze ndị Igbo na mba ọzọ na-abụghị ala Igbo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: