Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Serena bụ akajiakụ mbụ ụmụnwaanyị
N'egwuruegwu, Serena Williams bụ akajịakụ mbụ n'ụmụnwaanyị ndị egwuruegwu
Ebe foto si, AFP
Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa
N'egwuruegwu, a kpọpụtala Ezenwaanyị tenis bụ Serena Williams dịka onye mbụ na ndị akajiakụ n'egwuruegwu ụmụnwaanyị na mba ụwa.
Akwụkwọ mgbasa ozi Forbes dere nke a ụnyahụ.
Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ ebeela akwa
Ndị nzụkọ gọọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjịrịa agbarụọla ihu maka etu ha che na gọọmenti etiti sị abado ọrụ mmepe na mpaghara ahụ.Ha kwuru nke a mgbe ha gara ịlebe anya na ihe ndepụtara maka otu gọọmenti etiti siri rụọ ọrụ mmepe na mpaghara n'afọ 2017 bụ nke ha sị na ojucheghị afọ.
Mana gọọmentị etiti sị na ha na-enweta oke ruru ha
A maala Paul Manafort ikpe ịgba ọsọ ụtụisi
Ebe foto si, Getty Images
Manafort rituru dịka onye nchịkọta ndọrọndọrọ ọchịchị Trump n'ime ọnwa abụọ obidochara ọrụ
Nelson Chamisa bụ onye so zọọ ọkwa ọchịchị onyeisiala ndị Zimbabwe, ekwuola na aka enwe bara na ya bụ ndọrọdọro nke ya na Emmerson Mnangagwa zọrọ ụbọchị anọ gara aga.
Mnangagwa mechara merie na ya bụ ndọrọndọrọ dịka e si kpọpụta ụnyaahụ.
Ebe foto si, Nysc
Enwere kepukepu na-achọrọ ibuki ụkwọ ọnwa ndị NYSC nsonso a
Minista na ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na ọnweghị mgbe gọọmenti etiti ji kweta maka ibuli ụkwọ ọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna akpọrọ NYSC na Bekee
Na otu aka ahụ, onyeisiala Mohammadụ Buharị kwukwara n'uche ya ka dị na-ịkwado ụmụ amala ahụ ji otu afọ efe ala nna.
Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a
BBC Nkeji
Lee ihe nkiri anyị
2019: E ji Ndigbo eme akaje