Ihe isii ọ na-eri ịgba akwụkwọ Katolik na Naijiria?

Ndị na-agba akwụkwọ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agbamakwụkwọ abụghị ụkwa achị na'aka n'ụka Katọlik

N'ụka Katọlik na Naijiria, agbamakwụkwọ abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba.

Nchọpụta BBC mere gosiri na ọtụtụ atụmatụ na nkụzi eji akwadọ agbamakwụkwọ n'ụka Katọlik na-eri oge, ego ma sikwa ike.

Ọ na-ewe opekata mpe ọnwa isii iji kwado ma gba akwụkwọ n'ụka Katọlik na Naijiria.

Na nkọwa ya, otu nnukwu ụkọchukwu ụka Katolik na Lagos Steetị bụ Monsignor Bernard Okodua kwuru na ọ bụ ijikwado ndị a nke ọma.

Okodua gwara BBC sị, "O kwesiri ka ndị mmadụ dị njikere ime ihe kwesiri ka ha mee iji gba akwụkwọ n'ụka dịka iwu Chukwu na nke ụka siri dị."

Otu onye nkụzị alụmdinanwunye n'ụka Katolik dị na Legos, bụ Anselm Uzoma kọwara na nkụzị a nke a na- akuzi na atụmatụ ndị ọzọ so bụ iji kuziere ndị na-akwado ihe niile ha kwesiri ịmata tupu ha agba akwụkwọ.

Image copyright Getty Images

Ọ sịrị: "Ihe ndị a niile dị mkpa n'ihi na alụmdinanwunye bụ onye gbara ọsọ banye, ya agbara ọsọ pụta."

Ọriakụ Benedatte Etinosa, onye gbara akwụkwọ na St Sabina Catholic Church Idimagoro, Lagos, na ọnwa November afọ 2017 kwenyere na ịgba akwụkwọ Katolik siri ike, "mana i jisie ike mee ihe ụka sị gị mee, ị ga-ahụ uru dị na ya n'ihi na ị mara na ọ bụghị ihe ị tụtara n'ala."

Atụmatụ ndị ahụ gụnyere:

1. Mkparịtaụka gị na ụkọchụkwụ

Ụkwụ mbụ onye ọbụla na-akwado ịgba akwụkwọ na Katọlik na-abụ ị ga-ahụ ụkọchukwu ma kọwapụtara ya ebụmobi gị, ya agba gị na ọnye gị na ya na-akwado agbamakwụkwọ ajụjụ ọnụ ijị mata ma ụnụ adị nkwadebe. Tupu nke a eme, ụkọchụkwụ ga-eji na aka na ị bụ ọnye na-abịa ụka ahụ.

Ọriakụ Etinosa kwuru na "Mgbe m huru Fada, ọ gwara m na mu na di m ga-eso biakọta ọnụ ị gwa ụka ebumnobi anyị."

2. Ọkwa agbamaakwụkwọ

Ana ama ọkwa agbamaakwụkwọ (banns of marriage) ndị na-akwado izu ụka atọ n'ụlọ ụka obodo ya na ebe niile ha biri. Onye nkụzị alụmdinanwunye n'ụka katolik dị na Legos, bụ Anselm Uzoma, kọwara na nke a bụ i ji me ka amata ma onye ahụ onwere onye ọzọ ọ lụrụ.

3. Nyocha na ikike sị n'aka ụlọ ụka obodo

Ha ga-agakwa n'ụlọ ụka dị n'ime obodo ha ị nata ikike na nkwadọ, ebe a ga-enyocha, makwa ọkwa agbamaakwụkwọ ahụ ọzọ. Tupu nke ahụ eme, onye na-akwado ịgba akwụkwọ ga-anata akwwụkwọ n'aka ọtụ ndị ntorobia nke ụka.

5.Ụgwọ dị iche iche

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ego Naira ndị Naịjirịa

Ndị na-agba akwụkwọ na-atụ ọtụtụ ụtụ dị iche iche.

Oriakụ Etinosa kọwara: "Oge m wegara ọkwa, ha gwara m na m ga-akwụ ego youth na chọchị development. Ha nara m N6000 maka ịmepe ụlọ ụka ime obodo. Ndị youth nara m N3,000. Mana, na Legos, onweghị ihe ọbụla ha nara anyị."

6. Nkuzi agbamaakwụkwọ

A macha ọkwa, ma o nweghị onye megidere ya, onye ọbụla na-akwado ịgba akwụkwọ na-aga nkụzi ọnwa isi nke bụ iwu tupu agba ya akwụkwọ.

Oriakụ Etinosa sị, "Di m abụghị onye Katọlik, mana dịka iwu Katolik siri dị, o sonyere na nkuzi ahụ. Soso ihe dị iche bụ na ụbọchị agbamakwụkwọ, ọ gaghị a nata oriri nsọ."

Ọ bụ ka nke a mechara ka ndị chọrọ ịgba akwụkwọ na ụkọchụkwụ na-atulekwa ma nwe mkpebi ụbọchị ha ga-eme emume agbamakwụkwọ ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii'

Isiokwu Ndị Emetụtara