Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: Mmadụ 91 anwụọla n'ala ọma jijiji Indoneshia

Akụkọ ndị dị mkpa

Na mba ofesi,

Ndị nwụrụ n'ihe mberede ala ọma jijji mere n'obodo Lombok dị n'Indoneshia n'ụtụtụ ụnyaahụ, arịgoola n'ọnụọgụgụ ka ndị ọrụ na-ekwu na mmadụ iri itoolu na otu nwụrụ.

Ihe karịrị mmadụ narị merụkwara ahụ, ebe ndị bi n'obodo Bali bụ agbataobi Lombok na-agbahapụ ụlọ ha eri mbombo ọsọ.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Egwu ji ndị mmadụ aka

Udo ọ ga-alọghachị n'etiti Ipob na Ohaneze Ndigbo?

Ndị otu IPOB gbahapụrụ Ohaneze Ndigbo na ndị otu Igbo Leaders of Thought ka ha zukọrọ n'Ọgbarụ dị n'Anambra steeti ịkpa maka etu a ga-esi kwụsị ịkpọ ha ndị "oyiegwu", dịka akara Twitter ndị Radio Biafra si kwuo.

Ndị NYSC nwụrụ na Taraba

Ebelebe gburu ka mmiri Mayo-Selbe dị na Taraba steeti, riri mmadụ itoolu na-efe ala nna ha.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ David Missal kwuru na mmiri malitere ito na-akaghị aka, ma kwuo na ahụla ozu mmadụ asaa n'ime ha.

N'egwuregwu,

Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Jose Mourinho, ekwuola na afọ a ga-esiri ndị otu ya ike ma ọ bụrụ na ha azụtakwughị ndị ọzọ.

O kwuru nke a ka ndị Bayern Munich merichara ha n'asọmpi International Champions cup ụnyaahụ.

Ihe nkiri nke taa

Ikechukwu Uche kwuru na obi dị ya ụtọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIke Uche: Nrubeisi bụ ụzọ eji eme nke ọma na bọọlụ