BBC Pidgin ahaziela ịmaaka n'edemede asụsụ Pidgin

Girl dey read

Ebe foto si, Getty Images

Ogbo anyi n'ụlọọru ntaakụkọ BBC bụ BBC Pidgin ewepụtala atụmatụ ụmụakwụkwọ nọ mahadụm dị ichieichie na Naịjirịa ga-eji maaka n'ide akụkọ n'asụsụ Pidgin.

Ndị ga-eso n'ịma aka ahụ ga-edere ndị haziri ịmaaka a akụkọ mkpụrụokwu ya si narị asatọ (800) ruo otu puku (1000) nke metụtara isiokwu "Ndi ntoroọbịa Afrịka ha dịla njikere ịchị ọchịchị." nke a ga-eziga n'akara email a bbcpidgin.essay@bbc.co.uk .

Ndị ga-etinye anya n'asọmpị a iji họpụta ndị akụkọ ha nwere ume si Naịjirịa, Gana na Kameron.

Ndị a nwere ndị ọkamụta, ndị ode akwụkwọ Pidgin na ndị ntaakụkọ n'ime ha.

Ebe foto si, iStock

Nkọwa foto,

A ga-akwụrụ nye meriri asọmpị ụgwọ akwụkwọ oji agụ na mahadụm

Ha ga-ahọpụta onye mmeri na ngwụcha.

Iwu ji edemede Pidgin ga-echekwa atumatụ a. Ya bụ, onye ọbụla chọrọ ị ga n'ihu n'asọmpị a ga-ahụ na edemede ya kwụ ọto.

A ga-akpọpụta onye meriri n'asọmpị a n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2018.

Onye meriri ga-enwete uru, nke ị kwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ oji aga mahadụm n'otu afọ.

Ịmaaka a malitere taa, ọ ga-emechi n'abalị abụọ nke ọnwa Seputemba.

Zigara bbcpidgin.essay@bbc.co.uk akụkọ gị ugbua.

Onye ndụ BBC Pidgin bụ Adejuwon Soyinka sị:

"Atụmatụ edemede na Pidgin a bụ mbụ ụlọ ntaakụkọ dịka BBC na-eme n'ụwa. E mere ihe a iji kwado edemede na Pidgin na Mpaghara Afrịka nke ọwụwa anyanwụ."

Onyeisi BBC nke asụsụ dị icheiche n'ọwụwa ọdịda anyanwụ nke Afrịka bụ Oluwatoyosi Ogunseye si:

"Kemgbe otu afọ gara aga BBC Pidgin bidoro bụ oge ezigbote ọṅụ. Nke mere ịmaaka a ga-akwado iji asụsụ Pidgin na-akparịta ụka n'etiti ndị ntoroọbịa."

Ga na BBC Pidgin ka-inwete ihe gbasara akụkọ a n'uju.