Saraki akpọọla ndị isi ụlọomeiwu oku

Ebe foto si, Twitter/The Senate
Onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu bụ Bukola Saraki na ndị isi ụlọomeiwu nke ukwu na nke nta ga-enwe nzụkọ n'ụlọọrụ ya n'Abuja taa bu Tusde.
Otu onye ya na Saraki na-akpakọ bụ onye gwara BBC nke a.
O kwuru na nzụkọ a, nke ga-emetụta ndị Sineti na ndị ogbo ha n'ụlọomeiwu nke nta, bụ ihe dị mkpa maka okwu na ihe ndị ha ga-ahazị.
Ọ sị na okwu ha ga-emụtata ntuliaka nke afọ 2019 na ihe gbasara ngafe pati na-eme n'etiti ndị omeiwu na ndị ndọrọndọrọ ọzọ.
Mana o kwuru na-agaghị etinye ọnụ n'ihe banyere ọnọdụ Saraki dịka onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa.
"Nke a abụghị otu n'ime ihe anyị ga etinye ọnụ," onye a gwara BBC.
Na ngwụcha ọnwa gara aga, ndị ụlomeiwu gara ezumike dịka ọtụtụ mmadụ si pati na-achị bụ APC gawa PDP.
Ugbua, enwere akụkọ BBC amagbeghị isi ya na-ekwu na ndị APC chọro ịchụtụ Saraki n'ọkwa.