Ndụ Ekweremadu dị n'aka Ndume - Ndị ụlọomeiwu Igbo

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:

Image copyright Nigerian Presidency
Nkenke aha onyonyo Onye na-arụ dịka onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo nyere iwu ọkụ ka onyeisi DSS bụ Lawal Musa Daura ritua ozigbo ma nyefee ikike n'aka osote ya

Osote onyeisiala na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osinbajo ejirila iwe chụtuo onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Lawal Musa Daura.

Cheta na ndị ọrụ nchekwa DSS wuchiri n'ụlọ ndị omeiwu taa ma gbochie ha ịba n'ime ọgba ụlọomeiwu.

Image copyright Getty Images

Ndị ụlọomeiwu ntaa si na mpaghara ọwụwaanyanwụ ekwuola na ha ga-ejide Sinetọ Ali Ndume ma ọ bụrụ ọkọ ọbụla kọọ Ike Ekweremadu n'aka ndị EFCC.

Onye ndu ha bụ Chukwuma Onyema kwuru na Ali Ndume na-afụnye ndị EFCC ọkụ maka inyocha Ekweremadu.

Mba Ofesi:

Image copyright Reuters/AFP

Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka ekwuola na mba Amerịka na mba ọbụla ha na ndị Iran na-azụkọ ahịa agaghị enwe mmekọ.

Nke a bụ maka mmachi azụmahịa ọ machiri mba Iran maka ngwaagha nuklia.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Onye so nwere otu bọọlụ Arsenal bụ Usmanov ekwetela ịnaara ego dị Paụnds nari ise na iri ise site n'aka ogbo ya bụ Stan Kroenke iji zụkọrọ otu Arsenal kpamkpam

Kroenke nwere pasentị iri isii na asaa ebe Usmanov nwere naanị pasentị iri atọ n'ọnụ ego Arsenal.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkwa ụzọ Nkwe na Ezere