Saraki: Agbanyeghị ihe merenụ ike ọrụ agwụbeghị anyị

Ụlọomeiwu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Saraki chọrọ ka gọọmentị etiti nyochaa ma mara ndị aka ha dị na ya bụ nsogbu ikpe

Bukola Saraki bu ụzọ chetara ndị mmadụ etu ndị ọrụ nchekwa a kporọ DSS kpuchiri ihu ha si gbochie ndị omeiwu na ndị ọrụ ha ịbanye n'ụlọomeiwu.

O kwuru na ihe a bụ ihe ihere nke na-ekwesịghị ime; ''Ihe a butere obodo anyị bụ Naịjirịa aha ọjọọ ma mịtara anyị mkpụrụ ọjọọ.''

Saraki kwuru na ya bụ omume gosiri adịghị ike ndị chọrọ isi azụ ụlọ chutuo ndị isi ulọomeiwu.

Image copyright @SPNNigeria
Nkenke aha onyonyo Saraki na-arịọ ka gọọmenti kpachapụ anya maka ''gọọmentị dị n'ime gọọmentị'' ha

Ọ dọkwara aka na ntị nye ndị na-achọ ihe n'ike n'ike sị na okwu a abụghị maka ya maọbụ osote ya bụ Ike Ekweremadu maọbụ Yakubu Dogara, kama ihe a metụtara ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjịrịa.

Saraki kwuru na ọtụtụ olileanya dị n'ebe Naịjirịa nọ n'etiti obodo ndị ọzọ, ya mere ihe a ji jọgbuo onwe ya.

N'ọnụ ya, ''Naịjirịa agafeela ụdịrị iberibe a na-ebute ndọghachi azụ.''

"Chetanu na n'oge na-adịghị anya e kwuru m na Naịjirịa nwere ọchịchị n'ime ọchịchị a nọ ụgbua makana ọ gbawojuru anya ka onyeisi otu ngalaba ga-esi nye iwu ka a gaa wakpoo ụlọomeiwu.

"N'agbanyeghị ihe egwu dị na ya, anyị ga-aga n'ihu igbaso ikpe na-akwụghị ọtọ. Ndị Naịjirịa gosiri ụnyaahụ na ha agaghị ekwe mmegide oche maọlị.

"N'ihi na ọ bụ ndị Naịjirịa tinyere anyị n'ụlọomeiwu, mkparị ọbụla e nyere anyị bụkwa ndị Naịjirịa ka e nyere ya.

"Ihe mmụta m chọrọ ka gọọmentị etiti mụta ebe a bụ ka ha nye ndị ọrụ nchekwa ikike ịkwụrụ onwe ha."

Ihe niile o kwuru dị n'akara Twitter ya:

Mana lee ihe ndị Naịjirịa na-asa onyeisi ụlọọmeiwu ukwu na Twitter:

@Mansur_ahmed kwuru na mgbe izuụka a gachara, uche onye ọbụla ga-apụ n'ihe a mere n'ụlọomeiwu.

Ebe @ola_subomi01 kwuru na ihe a ga-eji cheta Saraki ma ọ nwụọ abụghị ihe nwere isi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a