N'Anambra onye uweojii agbagbuola ojiegoachụego

Ndị uweoji Naịjiria Image copyright Getty/AFP

Akụkọ kwuru na otu onye uweojii ya na ndị otu ya na-ana aka azụ gbagburu ojiegoachụego aha ya bụ Chinonso Onyeme n'Awka, Anambra steeti.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu n'ime ndịuweojii nọchịrị ụzọ ma naana ndị kwọ ụgbọala aka azụ, gbanyere egbe n'ụgbọala Toyota Sienna onye nwụrụ anwụ nọ n'ime ya, nke mere ka enyi ya sonyere ya gbapụta na-eti mkpu na a agbaala ogbo ya egbe."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Anambra steeti bụ Harụna Mohammed gwara BBC na ndị uweojii "ga-enyọcha ebubo amaghị eme nke onye otu ha ọbụla."

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara