Ipob: Ihe anyị jiri kagbuo mkpebi udo anyị na Ohaneze

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIpob na ohaneze

Otu n'ime ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Ụkọchukwu Innocent Chukwudi Peace gwara BBC Igbo ihe mere ndi otu ha jiri kagbuo mkpebi ha na Ohaneze nkwa ndị gọvanọ na-achị steeti ndị ọwụwa anyanywụ nwere.

Ụkọchukwu Peace kwuru na Ipob gbara mbọ ịhụ na ha na Ohaneze nakwa ndị ọchịchị nwere ọtụ obi mana ha hụru na ndị a achọghị ihe a chọrọ.

Ọ sị n'be Ipob chọrọ ihe Bekee kpọrọ "Referendum", Ohaneze na ndị gọvanọ ala Igbo chọrọ ka ha nwete osote onyeisiala n'aka PDP na ntuliaka nke 2019.

Peace sị na ọ bụ ihe mere ha jiri gbaa ha azụ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ebumnuche Ipob bụ ka Ohaneze na ndị gọvanọ ala Igbo jiri aka ha ji kwado mkpebi gọọmentị etiti mere maka ịkpọ Ipob otu na-eyi egwu ji hụ na akagbụrụ ya.

Gee Ụkọchukwu Peace ntị ọfụma n'elu:

Image copyright Getty Images

Cheta na otu a na-achọ mmwereonwe mba ha kpọrọ Biafra bụ Ipob akagbuola mmekọ dị n'etiti ha na otu na-achịkọta Igbo bụ Ohaneze.

Ipob kwuru unyaahụ na ha na ruru mkpebi a makana ndị gọvanọ ala Igbo na ndi isi Ohaneze emeghị ihe ha gwara ha mee, nke bu ka ha mee ka ewepụ aha Ipob n'ime ndị na-eyi egwu na Naịjirịa.

Atụmatụ udo n'etiti Ipob na Ohaneze nakwa ndi gọvanọ ala Igbo sitere n'aka ọkammụta Ben Nwabueze.

Na nzụkọ Ipob na Ohaneze nwere n'ọnwa abụọ gara aga, ha kpebiri na ha na Ohaneze ga adị n'udo ruo mgbe emezuru arịrịọ ha nke metụtara iwepụ aha ha n'akwụkwọ edere ndị otu ọjọọ.

Ka osi dị ugbua, Ipob akabuola emekọ ọbụla n'etiti ha na ndị Ohaneze, maọbụ ndị gọvanọ ala Igbo. Ha kwukwara na ha na ndị a agaghị emekọta nzụkọ

Mkpebie dị na akwụkwọ mgbasaozi Emma Powerful bụ onye ode akwụkwọ mgbasaozi Ipob zigara ndị ntaakụkọ.

Image copyright Enugu STate Police / Twitter

Powerful sị n'ime ọnwa abụọ ha n'Ohaneze nwere nkwekọrịta a, ruo nzụkọ nke Ọgọọst 8, 2018 n'Enugwu, Ipob hụrụ na onweghị ezigbo ebumnobi Ohaneze na ndị gọvanọ na-achị ala Igbo nwere n'ebe Ipob nọ.

"Ha achọghị ịhapụ ndị Fulani ha na agbara odibo," Powerful kwuru.

Ipob gakwara n'ihu kwuo na nzụkọ niile ha na Ohaneze mere enweghị isi.

BBC Igbo kpọrọ ekwentị onyeisi Ohaneze ịnụ onu ya maka ihe mere mana ọzaghị.

Cheta na gọọmentị Naịjirịa kwuru na Ipob bụ otu na-eyi egwu, nke ọkaikpe binyere aka si na ọ bụ eziokwu n'afọ 2017.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Rev Peace Gwara BBC

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a