Nwa Baby: Gịnị jịkọrọ Davido na Ndigbo?

David Adeleke (Davido) Image copyright Getty Images

Aha Davido na-ewuewu ugbua na soshal midia maka egwu ọhụrụ ya bụ 'nwa-baby' o tipụtara n'etiti abali taa.

David Adeleke a ma dịka Davido emepụtalarị 'Assurance' o tiri maka enyi ya nwaanyị bụ Chioma nakwa ọzọ wuru ewu bụ 'Flora my flawa'.

Mana ị ma ụzọ Davido jiri yie ndị Igbo?

  • 1. Ọ na-ayị onye Igbo.

Kemgbe mbido 2018, ihe kacha ewu na ndụ Davido karịchaa egwu ndị o tiri na nturuugo BET o ritere na mba Amerịka, bụ enyi ya nwaanyị bụ Chioma Avril Rowland.

Nkwupụta Davido na ọ na-ayị Chioma so mee ka ọtụtụ ndị Igbo bido ị hụ ya n'anya karịchaa etu ọ dị na mbụ.

Ka Davido bidoro ịyị Chioma, e setere ya n'ihe nkiri ebe o kwuru sị na "ndị Igbo na-enwe mmeri".

  • 2. O tiela egwu nwere aha Igbo.

Davido tiri egwu aha ya bụ 'NWA BABY'.

Image copyright Twitter/@iam_Davido
Nkenke aha onyonyo David Adeleke

N'agbanyeghị na ọ bụ onye Yoruba, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka na ọ na-ayị onye Igbo mere o ji họrọ aha Igbo.

@iamflamie1 na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo na-anwakwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara