Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Ama m na ndị Igbo agaghị akwado m ma m zọọ onyeisiala na 2023 - Rochas
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Rochas ọ chọrọ ịzọ onyeisiala?
Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ ndị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ ya kacha nwee ohere ịbụ onye Igbo mbụ ga-abụ onyeisiala Naịjirịa ma ọ zọọ na 2023.
Mana o kwuru na ọ ma na Ndigbo agaghị ekwe akwado ya, ma kwuo na nkwado ya ga-esi n'aka ndị si mpaghara ndị ọzọ.
O kwukwara na enweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị Igbo ọzọ a ma etu e si mara ya na mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ.
Rochas kwuru nke a ka ya na ndị ntaakụkọ zukọrọ n'ụlọọrụ ya n'Owere nso nso a.
Ebe ọzọ na Naịjirịa:
Ebe foto si, Edufun Technik STEM center
Ụmụada ise a si Regina Pacies Secondary School Onitsha, 'Anambara steeti meriri n'asompi Technovation 2018
Naijiria eturula ugo dịka ọkaibe n'ụwa niile n'asompi Technụzụ e mere na mba Amerika ụnyaahụ.
Ụmụada ise si ụlọakwụkwọ Regina Pacie dị na Ọnicha, nọchitere Naijiria ji technuzu a kpọrọ, 'FD Detector,' ha mepụtara iji buso nsogbu ọgwụ adigboroja ọgụ n'ala Naijiria, were turu ugo dịka ọkaibe n' asompi Technovation.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ụmụaka Igbo eturula ugo ọkaibe na technụzụ na mbaụwa
Mba Ofesi:
Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii na mpaghara obodo Fredericton dị na mba Canada, anwụchiela otu onye gbagburu mmadụ anọ gụnyere ndị uweojii abụọ.
Ha ka na-enyocha ihe butere ịgba egbe a.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
FIFA amachiela Kalusha Bwalya bụbu onye nchịkọta nakwa ọgba bọọlụ otu egwuregwu Zambia, afọ abụọ.
Ha machiri ya ka ha nyochapụtara na ya na Mohammed Bin Hammam bụ onye Qatar FIFA machiri ndụ ebighịebi mere nrụrụaka.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa:
Ị hụla nwaanyị Igbo a na-eji ịnya ụgbọala akpa ego?
Nwaada a jị ịnya ụgbọala akpata ego