A gbagbuola ndị uweojii anọ na Kaduna

Ndị uweojii Naịjirịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nọ na Benue maka nsogbu a na-ebo ndị ọchụehi

Ndị uweojii na Kaduna steeti kwuru na ndị oji egbe aga gburu ndị otu ha anọ ụnyaahụ n'obodo Jankasa nke dị nso obodo Rigasa dị n'okpuru ọchịchị Igabi na steeti ahụ.

Onye kwuru nke a bu ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Kaduna steeti bụ Sabo Yakubu.

Yakubu kwuru na mgbede ụnyaahụ ebe elekere isii, ndị uweojii nọ ọrụ na Jankasa danyeere ndị omekome.

"Ka ha na ndị omekome a gbakọrọ egbe, mmadụ ano n'ime ha lara mmụọ," Yakubu kwuru.

Ndị ji egbe aga na-akpa ike na mpaghara ụfọdụ na Kaduna, ọkachasị etiti Birnin Gwari ebe a tọọrọ mmadụ 80 n'ọnwa Mee nke afọ a.

Isiokwu Ndị Emetụtara