Sex change: A ga-agbatara ndị bụ nwoke na nwaanyị ọsọ enyemaka?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ na-eche n'ihu Aminu Kano Teaching Hospital dị na Kano
Ụfọdụ ndị nwere ihe e ji a bụ nwoke na nwaanyị na-eche ka nwunye onyeisiala Aisha Buhari, mezuo nkwa o kwere ịkwụrụ ha ụgwọ ha ga-eji awa ahụ ga-agbanwe ọnọdụ ha.
BBC bu ụzọ mee akụkọ otu nwoke bi na Kano nwere ihe e ji abụ nwoke nakwa nke nwaanyị nke Bekee kpọrọ 'genitals', mere ka oriakụ Buhari kwe nkwa na ọ ga-akwụrụ ndị ọzọ nọ n'ọnọdụ ahụ ụgwọ ahụ.
Nkwa enyemaka ahụ o kwere mere ka ọtụtụ ndị mmadụ pụta ikwuputa ọnọdụ ha, ọtụtụ n'ime ha bụ ndị si steeti ndị tere aka bịa.
Abdullahi Gunduwawa bụ onyeisioche ọrụ na-aga n'ụlọọgwụ Aminu Kano ahụ, gwara BBC na e nweela ndị ha wara ahụ.
Mana Gunduwawa kwuru na ha anụbeghị ukwere n'ebe nwunye onyeisiala maọbụ ndị na-arụrụ ya ọrụ nọ, kemgbe ha zigachara aha mmadụ 10 n'izu ole gara aga.
Dahiru Sule bụ onye ihe a bidoro n'aka ya
"Aha ikpeazụ anyị zigara bụ maka mmadụ 10 mana anyị anụbeghị ihe ọbụla n'aka ha, ndị chọrọ ka a waa ha ahụ na-enye anyị nsogbu n'ụlọọgwụ na-ajụ anyị 'kedụ kwanu?".
Dahiru Sule bụ otu onye n'ime ndị na-eche, ma rịọ ka nwunye onyeisiala nyere ha aka etu o si nyere ndị bu ha ụzọ.
"Nye anyị niile pụtara, ihe a bụ ọnọdụ igbanwe ndụ nye anyị, ka Hajiya Aisha nyere anyị aka kwụọ ụgwọ etu o si nyere ndị bu anyị ụzọ. Oge ọbụla anyị gara ụlọọgwụ, ha ga-asị anyị laa ma bịaghachite maka na nwunye onyeisiala ezitebeghi ego ọbụla."
BBC Pidgin kpọrọ Sulaiman Haruna bụ ọnụ na-ekwuchitere oriakụ Buhari, iji nụ ihe ji ha akwụbeghị ụgwọ ndị e zitere aha ha.