Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Falconets agafeela agba mgbapụ n'Iko Mbaụwa

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Falconets efeliela:

Image copyright Getty Images

Otu egwuregwu nta ụmụnwaanyị bụ Falconets efeliela dịka ugo n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị na-agafeghị afọ 20 (U-20).

Ha na China gbara onye laba onye laba (1-1), mana mmeri ha meriri mba Haiti mere ka ha nweta mgbakọ akara anọ mere ka ha bụrụ ndị nke abụọ ga-esi na 'group D' pụta.

Rasheedat Ajibade gbanyere goolu na nkeji 90+5 tupu e gbuchie bọọlụ.

Ihe mere n'Ọnịcha:

Onye amaghị onye ọ bụ tufuru nwa ọhụrụ na ebe Ọgbọ-Efere , nọ nso Head-Bridge, Onicha.

Nke a na-eme ka ọ orubeghị otu izuka e nwetara ozu nwa ọhụrụ n'Onicha.

Mba Ofesi:

Na mba ofesi, ọ fọrọ obere ka oringo taa isi ihe ruru mmadụ narị atọ.

Ndị a gara ebe a na-eti egwu n'obodo Vigo, dị na mba Spen, merụrụ ahụ ka akwa ha kwụ n'elu ya dapụrụ ma tụba ụfọdụ n'ime ha na mmiri.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Willian na agbara Chelsea bọọlụ ekwupụtala na ọ gaara agbaghapụ otu ahụ ma ọ bụrụ na Antonio Conte a chụrụ achụ ka bụ onye nchịkọta ha.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Benjamin bụ onye ji asụsụ Pidgin na-akọwa bọọlụ oge a gbara asọmpi Iko Mbaụwa, gwara BBC Igbo etu o si bido.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBenjamin: Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ