Ihe ị ga-eme maọbụrụ n'ịhụ nwata etufuru etufu n'ọhịa

Nwata atufuru etufu Image copyright EKWUZI CHIDINMA
Nkenke aha onyonyo Nwa ọhụrụ atụnyere n'ọwa mmiri

Obi ka na-agbawa ọtụtụ mmadụ hụrụ nwata ọhụrụ etụfuru ụnyaahụ n'ọwa mmiri n'Ọgbọ-Efere nke dị nso na Head-Bridge, Ọnịcha.

Mana o nwree ihe i nwere ike ime maọbụrụ na ị hụ ụdị ihe a n'ihu?

Gịnị ka i ga-eme maọbụrụ na nwata ahụ ka dị ndụ?

Otu nwaanyị aha ya bụ Maryanne Mapenzi na-arụ na Christianah Fate Foundation gwara BBC Igbo na ọdịzị n'aka ndị obi ebere ịgba mbọ hụ na nwata ahụ anwụghị.

Mapenzi kwuru na ọtụtụ oge ụmụ ọhụrụ ka dị ndụ oge ndị mmadụ hụrụ ha mana onweghi ihe ha na-eme maka ịzọ ndụ nwata a.

Ọtụtụ oge, ihe a na-eme makana ha amaghị ihe ha kwesiri ime ịzọ ndụ nwata ndị a.

Ihe ị kwesiri i me mabụrụ na ihu nwata ọhụrụ atufuru

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị ụmụaka na Naijirịa na-ata ahụhụ
  1. Chọta onye nche ọbụla nọ n'akụkọ ebe ahụ ga-achụpụ ndị gbakọrọ n'ebe ahụ.
  2. Kpuchie aka gị (yiri "glove" maọbụ "nylon" n'aka). Ọ bụru na i nweghi ihe ndị a, techa ncha eji asacha aka nke Bekee kpọrọ "hand sanitiser" n'aka.
  3. Lee anya nke ọma ma imi ọ na-eriputa ya n'imi, ọ bụrụ na imi na-arịpụta ya, were aka maọbụ ọnụ mịpụta imi ahụ.
  4. Maọbụrụ na nwata ahụ anaghị eku ume, ọdịghị na-aka ime ihe a na-eji akpọnite onye kubiri ekume nke Bekee kpọrọ CPR, mana mee ya sọọsọ maọbụrụ na ịmụtara ya nke ọma.
  5. Kuru nwata ahụ ngwa ngwa gawa ụlọọrụ ndị omeiwu.

Gịnị mere ọtụtụ mmadị anaghị azọ ụmụata ndị a?

Mapenzi kọwara na ndị mmadụ na-esepu aka n'ịzọ nwata ndị a etufuru etufu maka nsogbu ndị uweojii.

O kwuru na "Ihe a bụ ihe na-ebute nnukwu egwu, makana ọ bụrụ nwa ahụ nwụrụ n'aka onye chọrọ ị zọ ndụ ya, onye ahụ ga-aza ajujụ n'aka ndị uweojii.

Mana ọkaiwu Ebuka Iwuezi kọwara na iwu ala Naịjirịa ekpebịghị na onye zọrọ mmadụ nọ na nsogbu.

O kwuru na: "Ọ bụrụ na ịgbara mbọ nịịle ịlekọta nwata ahụ anya mana nwata ahụ mecha nwụọ, onweghị onye ga-awụchị onye ahụ makana nwata ahụ esighị n'aka ya nwụọ."

Mana Iwuezi kwusiri ike na ndị omeiwu kwesiri ihiwe iwu ga-echekwa ndị na-azọpụta ụmụaka.

Ihe ndị uwe ojii na-ekwu

Ọnụ na-ekwuchiri ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed gwara onye ntaakụkọ anyị n'elu ekwentị na ya hụrụ foto nwata ahụ etufuru n'Ọnịcha n'elu social media mana onweghị onye zitere ozi ọbụla maka mpu a n'ụlọọrụ ya.

Mana ọ gọsịrịke na onweghị ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla ga-anwụchị onye zọpụtara nwata ọhụrụ etufuru efuru.

Mohammed sị: "Udi omeme a pụtara na onye ahụ bụ ezigbo ala Naịjirịa."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara