SARS: Ngalaba a enwetala aha ọhụrụ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ahazigharịala SARS:
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nụchatara maka mwakpo ndị ọchị ehi na-eme na Shaki dị n' Oyo steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua a bụ ihe onyeisi ndị uweojii depụtara n'akara twitter ya maka SARS.
N'ọnụ ya, "Aha ọhụrụ ngalaba a ga-abụzi ''Federal Anti-Robbery Squad(FSARS)."
Ngalaba niile SARS ga-anọ n'okpuru FSARS bidi taa gawa.
Idris Depụtara n'akara Facebook ndị Uweojii Naịjirịa na n'ime ọnọdụ ọhụrụ a ahọpụta onye kọmishọna ga-abụzị onyeisi ndị SARS.
O kwukwara na ha ghazịgharị SARS maka iwu osote onyeisiala nyere maka ghazigharị ya bụ nagalaba nakwa ka ewee nabata mkpesa ndị Naịjirịa ma gboo y
Onye ntọ anwụọla:
Ị chetara onye gara ịtọ mmadụ n'Ondo steeti rahụfuo ụra ebe ahụ?
Akụkọ kwuru na ọ sila n'ụra fere n'ọnwụ ka ụbọchị itoolu o bidoro ịrahụ ụra maka ọgwụ ike Tramadol ọ ṅụrụ gachara.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla
N'etiti ndị APC na PDP:
Ụlọ omeiwu Naịjirịa ka nọkwa na mgbachi.
Ebe foto si, Nigeria Senate/Twitter
Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti
Ọ pụtara na ndịomeiwu alagachiteghi dịka onyeisiala riọrọ.
Ọzọ na-emekwa bụ na APC na-ebo ndị omeiwu PDP ebubo na ha chọrọ iwakpo ndị omeiwu APC maka okwu Saraki, ha bokwara Saraki ebubo mmegide Obodo.
Gụọ akụkọ a n'uju ebea: Nigerian Senate: Kedu ka o si kwụrụ taa?
Mba Ofesi:
Ihe mgbawa obi emeela na mba Italy taa ka akwa a kpọrọ Morandi dara n'obodo Genoa.
Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ iri atọ na ise anwụọla ebe ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị ụgbọala ha danyere n'ime mmiri nakwa ndị akwa ahụ dagidere ụlọ ha, merụrụ ahụ.
N'egwuregwu:
Onye egwu Chelsea bụ Tiemoue Bakayoko, ebinyela aka n'akwụkwọ ga-eme ka o bido ịgba bọọlụ n'Italy.
Bakayoko ga-agbara Ac Milan otu afọ, ka ha na Chelsea kwekọrịtara ka ha biri ya.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
BBC Nkeji
Ihe nkiri nke taa:
Benjamin bụ onye ji asụsụ Pidgin na-akọwa bọọlụ oge a gbara asọmpi Iko Mbaụwa, gwara BBC Igbo etu o si bido.
Benjamin: Ọ bụ inwe mkpebi ime onwe nyere m ọrụ