Anambra: Ụkọ mmanụ ebidola

Ụkọ mmanụ ụgbọala ebidola n'Anambra

Onye na-achọ mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Ndị bi n'Anambra steeti, ngalaba na-ahụ maka orire na ọzụzụ mmanu ụgbọala na steeti ahụ bụ Independent Petroluem Marketers Association of Nigeria agaala abụbụ ọrụ.

Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ndị ha kuturu ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ha ego iti aka n'obi dịka ha si kwe ha nkwa.

Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya, kwuru na ya bụ nsogbu metụtara ya na ndị be ya makana ha ahụghị mmanụ ụgboala ha ga-eji mụọ ọkụ Latrik.

O kwuru na ha ga-aga n'Asaba gaa gbata mmanụ ụgbọala ha ga-eji mee ihe.

CAN akpọọla ndị otu Kraịst ka ha bido ekpere

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ndị otu Christian Association of Nigeria (CAN) bụ Samson Ayokunle kwuru na ndị otu ha ga-eme ekpere ma burukwa ọnụ ụbọchị atọ maka ọgwụgwọ nsọ Naịjirịa.

Ha ga-eme ekpere a n'ubọchị iri abụọ na asaa ruo ụbọchị iri abụọ na itoolu n'ime ọnwa Ọgọstụ.

Mmiri eriela ụmụakwụkwọ 22 na onye nkuzi ha na Sudan

Ebe foto si, Getty Images

N'Afrika, mba Sudan na-ekpe ekpere ka mkpuruobi ụmụakwụkwọ iri abụọ na abụọ na onyekuzi ha nwụrụ na mberede mere na-etiti osimiri Nile laa na ndokwa.

Akụkọ kwuru na ha danyere na mmiri oge oke mmiri na-atụgharị ha n'osimiri ahụ.

Victor Moses agaala ezumike nka

Ebe foto si, Getty Images

Victor Moses ekwuola na ya agaala ezumike nka dịka onye ọgba bọọlụ Naịjirịa.

Marakwa na ndị otu egwuregwu nta ụmụnwaanyị bụ Falconets na mba Spain ga-ezukọ echi n'asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị a na-agba ugbua.

Gee nkeji nke abalị a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị

Aha onyonyo,

Lee ihe nzuzo ndị na-eme ude agaghị agwa gị