Carbon Monoxide: Tupu i gbanye igwe i ji amụ ọkụ, lee etu ị ga-esi chekwaa onwe gị

Generator Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ na-amụkarị igwe na-enye ọkụ maka na ọkụ anaghị adịkebe na Naịjirịa

Kwa ụbọchị ka akụkọ na-apụta etu gaasị Bekee kpọrọ "Carbon Monoxide" si egbu ndị mmadụ n'ụra.

Gaasị a na-esi n'igwe na-enye ọkụ enweghị usi nke o ji enwe agwa "color", nke mere na ị nwereike ikuru ya na-amaghị ama.

BBC Igbo kpọrọ Dọkịta McGinger Ibeneme, onye kwuru na ọ bụ ikuru ọtụtụ 'Carbon Monoxide' a ga-egbunwu mmadụ.

O kwukwara na ihe kacha ebute ya bụ nsogbu bụ mmadụ ịnọ ebe ikuku anaghị esinwu apụ, nke bụ na gaasị ọjọọ a bata n'ebe ị nọ, ma ọ hụghị ụzọ ọ ga-esi pụọ, ọ bụrụ nsogbu nye onye na-ekuru ya.

BBC Igbo gbara onye ọrụ nchekwa ajụjụọnụ maka egwu dị n'iji igwe ọkụ na-amụ ọkụ nakwa nchekwa dị mkpa maka ya.

Dibia Bekee Chuka Agunwa gwara BBC Igbo na egwu dị icheiche dị n'iji igwe ọkụ mụọ ọkụ ọkachasị egwu ọkụ ọgbụgba nakwa egwu anwụrụ ikwugbu mmadụ.

Nchekwa megide igwe na-enye ọkụ

  1. Agbanyela igwe ọkụ n'ime ụlọ, n'akụ ụlọ, maọbụ n'isi mpio maọbụ ebe ndị mmadụ na-anọpụga anọpụ - Dibia Bekee Agunwa kwuru na igwe ahụ na-ewepụta ajọ ikuku anaghi enwe ishi ọbụla nke a na-akpọ 'Carbon Monoxide' na Bekee nke na abanye mmadụ n'ahụ ma nochie ezigbo ikuku dị mmadụ n'ahụ. Ya mere na mmadụ kwesiri idobe igwe ahụ ebe dị na mbara ebe anwụrụ ya agaghị enwe ohere ọbụla ịba n'ime ụlọ ebe mmadụ nọ
  2. Ekwela ka mmiri na-ama igwe na-enye ọkụ gị - Igwe ahụ na-enye ọkụ na-ebu ọkụ latric aba n'ime ụlọ mana ọkụ latric na mmiri anaghị agakọ. Mmiri mesa waya ọbụla ọkụ si apụ n'igwe na-enye ọkụ ahụ o nwere ike ịdọgbu mmadụ. Rụọrọ igwe na-enye ọkụ gị ihe mkpuchi maọbụ ụlọ ebe agaghị ekwe ka mmiri maa ya.
  3. Ejila ekwenti gaa ebe igwe na-enye ọkụ nọ - ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ekwenti ha agba ọkụ ma ha chọrọ ịgbanye igwe na-enye ọkụ ha mana dọkịnta Agunwa kwuru na nke a bụ ihe jọgburu udele sigbuo nkakwụ maka na ekwenti nwere ikike na-enye ọkụ nke anaghị ahụ anya si ikuku nke nwere ike ime na igwe ọkụ ahụ ga-agbawali ma ekwentị dị n'akụkụ ya.
  4. Kwụsị ịgbanye mmanụ ma ọ na-asụ - Mmanụ ọkụ igwe ahụ na-eji enye ọkụ bụ nke na-agba ọkụ ọsịsọ ma ọ bụrụ na igwe ahụ na-asụ ị na-agbanye mmanụ, o nwere ịgba ọkụ.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ihe a

Mmadụ ise si n'otu ezinaụlọ dị mmadụ isii n'obodo Igboetche dị n'okpuru ọchịchị Etche dị na Rivas steeti anwụọla site n'anwụrụ ọkụ.

Ụdị anwụrụ gburu ezinaụlọ ahụ bụ nke si n'igwe na-enye ọkụ nke a na-akpọ 'Genereator' na Bekee.

Ndị nwụrụ n'ime ezinaụlọ ahụ bụ nne bụ Onyinye Monye, nna bụ Andrew Monye na ụmụaka atọ n'ime anọ.

Akụkọ kwuru na ezinaụlọ ahụ gbanyere igwe ahụ na-enye ọkụ ahụ dobe ya n'ime ụlọ ebe ha na-asa ahụ were labaa ụra.

Mana ndị ọrụ nchekwa na ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na anwụrụ si n'igwe ahụ enweghị ebe o si apụ, kama ọ bara n'ime ụlọ niile wee tọgbuo mmadụ ise ahụ n'ụra.

Naanị otu onye ka a gbapụtara n'ime ha bụ otu nwa ha dị afọ 13 bụ onye e bugara ụlọọgwụ mana ụmụnne ya ndị ọzọ dị afọ 15 na afọ 11 nwụrụ n'ụra ha.

Otu onye obodo ahụ kwuru n'igwe ahụ na anọbu na mbara mana ọ bụ ohi e bidoro na-ezu n'akụkụ ebe ahụ mere ha ji bubaa ya n'ime ụlọ.

Mana ụfọdụ ndị ezinaụlọ ahụ ekwetaghị n'ihe a mere, kama, ha na-ekwu na ọ bụ nshi ka e nyere ụmụnne ha.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnamdi Omoni kwuru n'ezie n'ihe a mere, ebe e bugara ozu mmadụ ise ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu.

O kwukwara na ha na-eme nyocha banyere ihe ahụ mere.

Ọtụtụ ezinaụlọ na-eji igwe na-enye ọkụ amụ ọkụ na naịjirịa nke mere na ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara nchekwa dị icheiche igbochi ọkụ maọbụ anwụrụ si na igwe ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDr. Chuka

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara