Ndị uweojii n'Abia anwuchiela nwoke isi na-edina onwe ha

Nwoke na nwoke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ala na mba ofesi anabataala ndị nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị na-eme mmekorita

Ndị uweojii n'Abia steeti anwụchiela mmadụ isi ha na-ebo ebubo na ha bụ ndị na-eme mmekọ nwoke na nwoke.

Cheta na iwu ala Naịjirịa kpebiri na onyeọbula mere udi ihea ga-aga mkpọrọ ruru afọ iri na anọ.

Ndị uweojii kwuru na ha nwuchiri ha ebe ha nọrọ n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ na-eme mmọkọrịta.

Mana o nwere ndị n'ime ndị a kwuru na ebubo a abụghị eziokwu.

Ha kwuru na ha bịara ebe a maka mmemme ụbọchị ncheta ọmụmụ otu n'ime ha.

Onye ọzọ aha ya bụ Fred Ndubuisi bụrụkwa onye na-eme mmemme ụbụchị ncheta ọmụmụ gwara ndị nta akụkọ na ha banyere ọnụmara n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ a maka ị yi uwe ha ga-eji were mee mmemme a.

Ndubuisi kwuru na oge ahụ ka onyeisiụlọ oriri na ọṅụṅụ bata n'ebe ahụ nakwa bọ ha ebubo na ha bu ndị na-eme mmeko nwoke na nwoke.

Mana kọmishọna ndị uweoji na steeti ahụ bụ Anthony Ogbizi kwuru na ha bụ ndị otu ọjọ na kwa na ụlọ oriri na ọṅụṅụ na weta akaebe ha ga-eji nwe kpe ha n´ụlọikpe.

Akụkọ ga-amasị gị