Umar Ganduje abụrụla 'agụ na-eche mba' n'ala Igbo

Umar Ganduje abụrola 'agna-echemba'n'ala Igbo

Eze Eberechi Dick bụ onyeisi otu ndị eze si ọwụwa-anyanwụ etuola gọvanọ Kano steetị bụ Abdullahi Umar Ganduje ugo dika 'agụ na-eche mba 1' nke Ndị Igbo.

Otu a kwuru na ha turu Ganduje makana ọ gbara mbọ hụ na ndị Igbo na ndị be ya bi na Kano na-ebi n'udo.

Idemmiri egbuola ọtụtụ mmadụ n'India

Image copyright Getty Images

Na mba ofesi, akwa adaala n'obodo Kerela n'ala India ebe nnukwu ide mmiri gburu mmadụ nari atọ na iri abụọ na anọ.

Ugbua ndị gbata gbata na-anwa ịzọ ndụ ndị ọzọ biri n'obodo ahụ.

Ugbua mmadụ karịrị puku narị abụọ ka idemmiri a chụpụrụ.

Ntuliaka 2019 dị n'aka ndị Naịjirịa -INEC

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ INEC ekwuola na ntuliaka Naijiria ga-eme n'afọ 2019, ga-aga nke ọma ma ọ bụrụ na onye ọbụla jikọtara aka rụọ ọrụ ọfụma mgbe oge ahụ ga-abịa.

Emeka Ononamadu bụ onyeisi ụlọọrụ INEC kwusiri ike na ụlọọrụ INEC niile n'ala Naịjirịa dị njikere ịza ajujụ onyeọbụla nwere ugbua gbasara ntuliaka na-abịa.

Ụlọ dara na Jabi egbuola mmadụ abụọ

Mmadụ abụọ anwụọla, ebe a na-achọ ihe ruru mmadụ iri ka ụlọ elụ dachara na Jabi dị n'Abuja.

Akụkọ na-ekwu na ụmụaka na ndị na-ere nri so na ndị ka nọ n'okpuru ụlọ a dara ada.

Kevin de Bruyne ga-eji ọnwa atọ pụọ n'asọmpị niile

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, Kevin de Bruyne onye otu Manchester City agaghị eso n'asọmpị ọbụla ruo ọnwa atọ maka ahụ o meruru n'ụkwụ.

Gee akụkọ anyị nke abalị a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị

Isiokwu Ndị Emetụtara