Inec ekwuola ka ihe ga-esi gaa na ntuliaka 2019

Prof Mahmood Yakubu
Nkọwa foto,

E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015

Onyeisi Inec bụ Mahmoud Yakubu ekwuola na o nweghị ihe ga-eme ụbọchị ehiwere maka ntụliaka 2019 n'agbanyeghị ụkwụ a na-akpụ n'ala n'okwu gbasara ibinye aka na bọjetị maka ya dị n'ụlọomeiwu.

Yakubu kwuru nke a oge ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ ka ọ gachara ọgbakọ ya na onyeisi ọrụ gọọmentị bụ Abba Kyari n'Aso Rock n'Abuja.

"Ekwuola m ya ugboro ugboro, onweghị ọnọdụ ga-eme ka e yigharịa ntuliaka dịka iwu ịzọ ntuliaka siri dị."

O gara n'ihu kwuo na ntuliaka ga-abụ na Febuwarị 16, afọ 2019.

Dịka nke a na-eme, ụlọọrụ ya, wepụtara ọkwa n'Abuja n'ụbọchị Fraide nke kwuru na e hiwere otu pati ịnara akwụkwọ maka ngosi mmasị ịzọ ọchịchị nke Bekee kpọrọ 'nomination form' na etiti nakwa steeti bido n'Ọgọstụ 17 rue 24.

Ụlọọrụ akụkọ NAN kwuru na a madoro ọkwa ahụ n'ụlọọrụ Inec dị n'Abụja.

Onyeisi nkuzi ihe gbasara ịtụ votu bụ Ndidi Okafor, gwara NAN na "ụbọchị ikpeazụ maka pati itinye akwụkwọ maka ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala n'ụlọomeiwu etiti na Disemba 3 nakwa ntuliaka nke steeti, bụ Disemba 17."

Okafor kwukwara na "INEC ga-agba ihe gbasara ndị ga-azọ ọkwa na ntuliaka etiti n'anwụ ụbọchị Ọktoba 25 nakwa nke ndị ga-azọ na ntuliaka steeti na Nọvemba 9."

Okafor gara n'ihu kwuo na Inec ewepụtala ụbọchị Novemba 17 dịka ụbọchị ikpeazụ maka pati iwegharị maọbụ gbanwe aha onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala nakwa ndị ụlọomeiwu nakwa ụbọchị mbụ n'ọnwa Disemba maka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: