Kofi Annan, onye bụbu odeakwụkwọ UN anwụọla

Kofi Annan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Kofi Annan bụ onye isiojii Afrịka mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi otu UN

Kofi Annan, onye bụbu onye odeakwụkwọ ukwu otu mbaụwa a kpọrọ United Nations(UN) anwụọla.

Ọ nwụrụ na mba Swizaland n'ụtụtụ taa bụ Satọde.

Annan onye bụ onye mba Ghana rụrụ ọrụ dịka odeakwụkwọ ukwu UN nke asaa bido n'ọnwa Janụwarị afọ 1997 rue Disemba afọ 2006.

Annan bụ onye isiojii Afrịka mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi otu UN.

Ọ bụ oge ọ nọ n'ọkwa dịka onyeisi UN ka okwu Agha Iraq nakwa nsogbu HIV/AIDS kpụ ọkụ n'ọnụ.

Annan mechara ruọ ọrụ dịka onye nnọchite UN na mba Syria, ebe ọ gbara mbọ maka iweta udo na mpaghara ahụ.

Ebe foto si, AFP

Annan bụ lụburu onye Naijiria aha ya bụ Titi Alakịja, ha gbasara n'afọ 1983, ọ lụọ Nane.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka Annan

N'akwụkwọ ozi onyeisi UN ugbua bụ António Guterres wepụtara, O kwuru na Annan bụ 'aka na-agbazi.'

"O nyere mmadụ niile,ebe niile ohere mkparịtaụka, ebe igbo mkpa na ụzọ gana-eduga ụwa ka mma."

Guterres kasiri nwunye ya bụ Nane Annan, ezinaụlọ ya nakwa ndị na-ebe akwa ọnwụ nwa Afrịca bụrụ ọkpa udo na mbaụwa."

Iji kwanyere Annan ugwu, onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo enyela iwu ka ewtuo ọkọlotọ ala ha ebe niile n'ala ha n'ụlọ ọrụ nnochiteanya ha na mba ndị ọzọ otu izuụka bido n'ụbọchị Monde, Ọgọstụ 20, 2018.

Osote mịnịsta mba Ghana na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Charles Owiredu gwara BBC n'ihe ahụ mere n'ezie sị na ọbụ ihe mwute na dike e ji eje mba dịka Kofi Annan ala mụọ.

Onyeisi mba Briten bụ Theresa may kwuru na ọ bụ "ihe mwute ịnụ maka ọnwụ Kofi Annan.

May kpọrọ ya, 'nnukwu onye ndu' na 'onye hazigharịrị UN' nke nyere aka ị mee ka ụwa dị mma ka ọ dị mgbe a mụrụ ya.

Emmanuel Macron bụ onyeisiala mba Frasi kwuru na ihe o depụtara n'igwe okwu Twitter ya n'asụsụ Frenchị sị na Fransi na-akwanyere Annan ugwu.

Macron sịrị na ha agaghị echefu ihu ya na-edere jụụ nakwa ike ọgụ ya.

Ụbọchị dị mkpa na ndụ Kofi Annan

  • 1938: A mụrụ ya na Kiumasi nke bụ obodo nke abụọ kacha mepe na Ghana
  • 1962: O bidoro ịrụ ọrụ n' ụlọọrụ United Nations dị na Geniva, mba Swizaland
  • 1965: Ọ lụrụ Agbọghọ Naijiria aha ya bụ Titi Alakịja,onye ya na ya mụrụ ụmụ abụọ;nwoke na nwaanyị
  • 1983: Ya naTiti kewara
  • 1984: Ọ lụrụ nwaanyị ọzọ,Nane Lagergren
  • 1991, Ejima ya bụ Efua nwụrụ
  • 1993: Ọ rigoro n'ọkwa onyeisi ngalaba ịkpaudo
  • 1997: E mere ya onyeisi( Secretary-General) nke asaa otu United Nations
  • 2001: O ritere nzere 'Nobel Peace Prize'
  • O rituru n'ọkwa dịka onyeisi ka ọọ chịchara afọ iri
  • 2012: E mere ya onyeisi otu' Elders, otu na-agba mbọ maka udo na ikike dịrị onye

Akụkọ ndị ga-amasị gị: