Savage Trap Queen: A na-akwụ m puku 80 ruo 100 n'ihe nkiri 'blue film'

Savage Trap Queen

Ebe foto si, Savage Trap Queen

Nkọwa foto,

'Akwụna dị iche n'ime ihe nkiri ndị gba ọtọ'

Ihe nkiri a na-agba ọtọ n'ime ya bụ nnukwu azụmahịa na Naịjirịa, mana n'agbanyeghị etu o si ewu ewu, ndị mmadụ na-akpọ ndị na-eme ya iyi ọtụtụ oge.

Ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri a na-agba ọtọ na ya nke a na-akpọ 'Blue film' na Naịjirịa anaghị ekwe egosi ihu ha, mana otu n'ime ha na-achọghị ịma ihe ndị mmadụ ga-ekwu a ma dịka 'Savage Trap Queen' gwara Ogechi Obidiebube bụ onye ntaakụkọ BBC, ihe ndị o jirila anya ya hụ n'ime akaọrụ ya na Naịjirịa.

Savage Trap Queen dị afọ 23 bidoro ime ihe nkiri ndị gba ọtọ kemgbe Ọktoba 2017, ma kwuo na ọ na-enweta ihe ruru puku 100 n'elu ihe nkiri ọbụla o mere.

O kwuru sị na ọ fọrọ obere ka ụdịrị ọnụ ọjọọ a na-agba ya gbuo mmasị o nwere maka ime ihe Bekee kpọrọ 'modelling', ọ kachasị oge a napụrụ ya nturuugo o nwetara site n'ịbụ osote onye meriri asọmpi ndị mara mma bụ 'Face of Africa'.

Ha kwuru na 'Ezenwaanyị ekwesịghị ime ihe nkiri ndị gba ọtọ', mana o kweghị ya gbuo mmụọ ya maka na ọ ka na-ahụta onwe ya dịka ezenwaanyị.

Aha onyonyo,

Ara m bụ oke ibu arụ nye m

Savage Trap Queen achọghị ịma maka ndị na-akpọ ya akwụna.

O kwuru "ezigbo ihe dị iche dị n'etiti ịgba akwụna na ime ihe nkiri ndị gba ọtọ. Ịgba akwụna bụ idina onye ọbụla nara ego, mana ihe nkiri ndị gba ọtọ bụ ime ejije ndina nwoke na nwaanyị, ọ bụghị nke na-eme n'ezie."

N'agbanyeghị na ndị mmadụ na-akpọ ya iyi, ọtụtụ ndị mmadụ na-elekwa ya ọfụma, nke mere na ndị na-eso Savage Trap Queen n'Instagram ebe ọ na-etinye ụfọdụ ihe nkiri ya, gafere puku 20.

Ebe foto si, Savage Trap Queen

Ndị mmadụ na-ezo na-eme ihe nkiri ndị gba ọtọ

Odoghị anya ego ole ndị na-eme ihe nkiri ndị gba ọtọ na-enweta na Naịjiria, maka na ha na-ezokarị ezo na-eme ya bụ ihe nkiri.

Nke a bụ maka na ha achọghị ibanye na nsogbu n'aka ndị otu ngalaba na-ahụ maka ihe nkiri (National Film and Video Censors Board) nke Naịjirịa.

Paul Ailewon bụ onyeisi nke arụmọrụ nke ngalaba ahụ na ndịda-anyanwụ, gwara BBC na a machiri ihe nkiri ndị gba ọtọ na Naịjirịa, mana ọ ma na ndị mmadụ na-ezo ezo eme ya.

O kwuru sị "ihe ọbụla a machiri amachi na-enwe ndị na-ezo eme ya."

'Ile ihe nkiri ndị gba ọtọ nwere nsogbu ndị ọ na-ebute'

Ihe na-atọ ụtọ na-egbu egbu, nke a ka Dkt Charles Umeh na-arụ na Lagos University Teaching Hospital (LUTH) kwuru ka ọ na-akọwa nsogbu ndị na-ele ihe nkiri ndị gba ọtọ nwere ike inwe.

Nsogbu mmepụta echiche

Nkọwa foto,

Ilebiga ihe nkiri ndị gba ọtọ oke nwere ike ibute mmadụ amaghị onwe ya

Ụmụokorobia na agbọghọbịa na-elebiga ihe nkiri ndị gba ọtọ oke, nwere ike imebi etu ha si ejikwata onwe ha, maka na uche ha etozubeghị ijidenwu ụdịrị ihe a 'na-atọ ụdịrị ụtọ a'.

Dkta Umeh kwuru sị na etu ọ dị ugbua, ọ na-elekọta otu nwaagbọghọ dị afọ 16 na-anaghị agụnwuzi akwụkwọ ya maka na naanị ihe juru ya isi bụ ịkwa iko maọbụ ile ihe nkiri ndị gba ọtọ ma ọ bụrụ na enweghị onye nọ ya nso.

Mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ

Ọtụtụ oge ka ndị na-ele ihe nkiri ndị gba ọtọ na-eji aka ha egbo onwe ha agụụ mmekọahụ n'otu aka ahụ.

Dkta Umeh kwuru sị na ka ndị ndị ofufe na-agbasa oziọma megidere mmadụ iji aka ya egbo onwe ya agụụ mmekọahụ, o nwere ike ime ka obi onye na-anụ ozi ahụ na-ama ya ikpe. O nwekwara ike ibute mmadụ ileda ugwu onwe ya nke Bekee kpọrọ 'low self-esteem'.

Ọtọmegbum

Onye na-elebiga ihe nkiri ndị gba ọtọ oke abụrụlarị onye ọ na-atọ na-egbu, nke pụtara na ọ gaghị amazị ihe o mere onwe ya ma ọ bụrụ na o leghị ya.

Nsogbu n'alụmdinanwunye

Dkta Umeh kwuru na di na nwunye na-ele ihe nkiri ndị gba ọtọ nwere ike na-enyocha onwe ha maka ịgba n'ezi.

Ha nwere ike na-ahụta ya na ọ bụ maka na ọ naghị emeta ya mma n'elu akwa mere o ji ele ihe nkiri ndị gba ọtọ oge niile.