Portharcourt: Ọgbaghara adaala na ntuliaka ha mere

Ogbagbara mere na ntuliaka ndị Rivers steeti

Ọgbaghara ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọgbaghara adaala na ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchi anya obodo Portharcourt n'ụlọome iwu ndị Rivers Steeti.

Akụkọ a kwuru na ndị akpụ obi ji egbe maburu igbe eji eme ntuliaka, ebe ndị pati APC na PDP na-ebo onwe ha ebubo n'ihe butere ọgbara ahụ.

Ndị mmadụ na-eri uju ọnwụ Kofi Annan

Buhari na Kofi Annan

Ebe foto si, Getty Images

Otu United Nation, mba Gana nakwa ụwa niile na-eri uju n'ọnwụ onye odeakwụkwọ United Nation n'oge gara aga bụ Kofi Annan.

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'okwu iti aka n'obi ya kwuru na Kofi Annan bụ nwoke dị umeala ma hụkwa mmadụ n'anya.

Ndị uweojii anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob

Nwaanyị Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị uweojii nwụchiri ụmnwaanyị Ipob na-eme nghariiwe n'Ọgọstụ 17,2018 n'Owere isi obodo Imo steeti

Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị na-eme ngagharị iwe n'Owerri ụnyaahụ

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Andrew Enwerem kwuru na onweghi onye nwụrụ oge ha na-anwụchi ụmụnwaanyị ndị a.

N'Egwuregwu:

Infantino

Ebe foto si, Getty Images

Otu FIFA ajụla atụmatụ njem nleta minista egwuregwu bụ Solomon Lalong chọrọ ime n'isi ụlọọrụ ha dị na Switzerland.

Otu egwuregwu bọọlụ dị na mba spen ga-amalite asọmpi La liga Santander nke afọ 2018 banyere 2019 n'abalị a.

Gee akụkọ anyị nke abalị a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo,

Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị