Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Gọvanọ Nyesom Wike na-ebo ndị uweojii Rivers ebubo

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Nyesom Wike ebola ndị uweojii ebubo

Image copyright Getty Images

Gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesom Wike ebola ndị uweojii ebubo na ha na-ebuso ndị steeti ya agha n'ihe gbasara usoro ntuliaka.

O kwuru na ha na ndị na-akwado APC jikọrọ aka mee ka ntuliaka e mere na steeti ahụ ụnyaahụ ghara inwe isi.

Akwammiri Third Mainland

Image copyright Getty Images

A ga-akpọchi akwa mmiri 3rd mainland dị na Lagos bido n'ime abalị iri abụọ na atọ ruo ime abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọgọst a.

Gọọmentị sị na nke a bụ ka e nwee ike nyochaa etu akwa ahụ dị maka ịrụ ya ọrụ na ngwụcha afọ a maọbụ mbido 2019.

Mba Ofesi:

Ụmụnwaanyị na-eme ihe siri ike o.

Image copyright Julie Genter Instagram

Julie Genter bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na mba New Zealand nyarala ịnyịnya igwe nke Bekee kpọrọ 'bicycle' gaa ụlọọgwụ ịmụ nwa mbụ ya.

O sonyela n'ọnụọgụgụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mụrụ nwa ka ha nọ n'ọchịchị.

N'egwuregwu,

Man City zọrọ Huddersfield ka mmọnwụ a na-akwa aka ka ha ji ọkpụ goolu isii ha satara naanị otu merie ha.

Image copyright Getty Images

Sergio Aguero gbanyere goolu atọ ebe David Silva na Gabriel Jesus nyere ndị nke ọzọ.

Jon Gorenc Stankovic gbanyeere Huddersfield otu goolu tupu onye otu ya bụ Terence Kongolo ejiri aka ya gbakpuo bọọlụ na neetị ha.

Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri nke taa:

Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ọnụ na-eru n'okwu n'egwuregwu akọwala ụfọdụ nsogbu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị na-enwe na Naịjirịa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara