Buhari agaala ịgba Sallah na Daura
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Buhari
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari agaala obodo ya bụ Daura ebe ọ ga-anọ agba sallah nke afọ a.
Cheta na Buhari ka si London ebe ọ gara ezumike ọ nọrọ ụbọchị iri na ise, lọta ụbọchị abụọ gara aga.
Ọchịchị Naịjirịa
Nwaafọ Igbo na-azọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa bụ Kingsley Moghalụ, gwara BBC Igbo na o nwere mkpịsị igodo e ji agbape akụnaụba Naịjirịa.
O kwuru na oge eruola mgbe a ga-akwụsị ịtụkwasị obi n'elu mmanụ agbịdị.
Mba Ofesi:
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị ụka katọlik na gburugburu ụwa niile bụ Pope Francis, akatọọla omume ịmetọ ụmụaka n'ụzọ mmekọahụ na mkpuchi ndị na-eme ya, n'ime akwụkwọ ozi o degaara ndị katọlik niile.
Ọ rịokwara mgbaghara na ha emeghị ihe ọsịsọ maka onye ụkọchukwu mba Amerịka e jidere.
N'egwuregwu,
Naịjiria agbanarịla iwe ọkụ FIFA ka ha gere ntị n'iwu kwuru ka ha kpọpụta aha Amaju Pinnick dịka onyeisi otu na-elekọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF.
Cheta na taa bụ ụbọchị ikpeazụ FIFA nyere Naịjirịa ịkpọpụta ya maọbụ a machie ha isonye n'asọmpi bọọlụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
BBC Nkeji
Ihe nkiri nke taa:
Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ọnụ na-eru n'okwu n'egwuregwu akọwaala ụfọdụ nsogbu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị na-enwe na Naịjirịa.
Gọọmentị gbahapụrụ egwuregwu ụmụnwaanyị na Naịjirịa.