2019 Election: Ndị Anambra lee ndị ntorobịa chọrọ ịnọchite anya unu

Chisom Jane Chude/Okekearu Kingsley Chukwuezugo

Ebe foto si, Chisom Jane Chude/Okekearu Kingsley Chukwuezugo

Ọtụtụ ndị ntorobịa n'Anambara chọrọ isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke afọ 2019 dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyechara aka n'akwụkwọ #NotTooYoungToRun.

Ụfọdụ n'ime ndị ntorobịa uche ha dị n'ịzọ ọchịchị n'Anambara ziteere BBC Igbo aha ha, na ha chọrọ ịnwa ike ha n'afọ 2019.

Lee ndị nke chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị n'Anambara steeti na ntuliaka 2019.

Ụlọomeiwu ukwu

1) Jude Ezenwafor dị afọ 42 bụ onye achụmnta ego nakwa onye nnukwu enyemaka pụrụ iche nke gọvanọ Anambara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ezenwafor bụ onye Nnobi chọrọ ịnọchite anya ndị Anambara Sentralụ n'ụlọomeiwu ukwu.

Ebe foto si, Jude Ezenwafor

2) Chika Raymond Chukwuma Aniemena dị afọ 36 bụ onye Ọka Saụt.

Aniemena chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị ndị Ọka Saụt n'ụlọomeiwu ukwu.

Ebe foto si, Chukwuemeka Aniemeka

Ụlọomeiwu nta

1) Amajua Collins Chukwuma dị afọ 28 bụ ọkaiwu.

Chukwuma bụ onye Awgbụ chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Nọt/Saụt constituency n'ụlọomeiwu nta.

Ebe foto si, Amajua Collins Chukwuma

2) Ike Chinedu Klinsmann dị afọ 40 bụ onye na-eme nakwa enye ọgwụ.

Ike bụ onye Umudiọka chọrọ ịnọchite anya ndị Anaocha/Njikoka/Dunukofia constituency n'ụlọomeiwu nta.

Ebe foto si, Ike Chinedu Klinsmann

Ụlọomeiwu nke steeti

1) Okekearu Kingsley Chukwuezugo dị afọ 28 bụ onye ọkaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Chukwuezugo bụ onye Enugu-Ukwu chọrọ ịnọchite anya ndị Njikọka 1 constituency n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Okekearu Kingsley Chukwuezugo

2) Chisom Jane Chude dị afọ 30 bụ ọkaiwu.

Chude bụ onye Ogboli-Olosi chọrọ ịnọchite anya ndị Ọnịcha Nọt n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Chisom Jane Chude

3) Franklin Nwadialo dị afọ 34 bụ onye achụmnta ego.

Nwadialo bụ onye Ọssọmala chọrọ ịnọchite anya ndị Ọgbarụ II n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Franklin Nwadialo

4) Ibeneme Chuchu Arthur dị afọ 36 bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara mmepe nke Bekee kpọrọ 'development consultant'.

Ibeneme bụ onye Agụlụzigbo chọrọ ịnọchite anya ndị Anaọcha II n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Ibeneme Chuchu Arthur

5) Ezenwafor Odera Peter dị afọ 30 bụ onye na-emepụta ihe nkiri na Nollywood.

Ezenwafor bụ onye Nnobi chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Saụt n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Odera Peter Ezenwafor

6) Tyndale Oforbuike Okoli-Egbo dị afọ 37 na-azụ ahịa n'ibughari ibu.

Okoli-Egbo bụ onye Nawfija chọrọ ịnọchite anya ndị Orumba Saụt n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ebe foto si, Okoli-Egbo

Ị ga-akwado ndị a?

Akụkọ ga-amasị gị