Ekweremadu: Mee ọchịchị onyeisiala na gọvanọ otu ọnụ afọ isii

Aha onyonyo,

Mee ọchịchị onyeisiala na gọvanọ otu agba afọ isii

Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị kwenyere n'ihe Ike Ekweremadu kwuru ka oge ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ bụrụ otu agba afọ isii.

Ndị a gụnyere onyeisioche United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie na ọkaiwu Chukwuemeka eze.

Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi ndị Sineti agbarụọla ihu n'ekpomaọkụ ndọrọndọrọ ọchịchị na-aga n'ihu na Naịjirịa ugbua.

Ebe foto si, @ike_Ekweremadu

Nkọwa foto,

Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị

Ọ gara n'ihu kwuo ka e mee oge ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ otu ọnụ afọ isii site n'ozi si n'akara Facebook ya.

Ọ gakwara n'ihu taa ọchịchị onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na ndị ọrụ ụta n'ịkwanye ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa iji hụ na ha lọghachịrị n'ọchịchị n'afọ 2019.

N'okwu ya "Ọ dị mwute na ekpomaọkụ ndọrọndọrọ ọchịchị tinyere imebiga ihe ike oke dị ugbua na Naịjirịa agaghị akwụsị rue mgbe ntuliaka afọ 2019 gafechara."

"Enweghị ike ịgbanarị ọnwụnwa dị n'ikike ọchịchị, ndị ọnụ na-eru n'okwu na-eme ihe niile ha nwere ike, iji ejigide ọchịchị."

Ebe foto si, AFP

" E kwesiri m ike n'otu ọnụ afọ ise maọbụ isii n'ọchịchị onyeisiala na nke ndị gọvanọ ma ntuliaka afọ 2019 gacha, dịka e si eme ya n'ọchịchị onye kwuo uche ya nke mba Latin Amerịka dị icheiche."

Ekweremadu kwuru na nke a ga-enye aka ibelata oke ekpomaọkụ dị na ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa na-emebiga ihe oke ndị ọchịchị dị n'etiti.

Ihe ndị ọnụ na-erụ okwu kwuru

Okorie bụ onye kwuru na ọ bụ Alex Ekwueme bụbu osote onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga wepụtara ọ dị n'aka Ike Ekweremadu na ndị omeiwu ọzọ ime ka atụmatụ a baa n'iwe na-achị Naịjirịa.

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ ọkaiwu Chukwuemeka Eze, o kwuru na atụmatụ a dị mma n'ihi na ndị ọchịchị na-achị naanị afọ abụọ were ndị ọzọ mee ndọrọndọrọ ọchịchị ịpụta ọzọ.

Eze kwuru na ọ ga-adị mma ka ọ bụrụ naanị ọtụ agba afọ isii, ka amaara onye rụrụ na onye na-arụghị ọrụ.

Cheta Ike Ekweremadu ekwupụtabuola atụmatụ n'oge mbụ n'otu ọgbakọ ndị Sineti mere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: