Igbo Ekunie: 'Tọpụnụ ụmụnwaanyị Ipob e ji eji'

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe

Ndị uweojii n'Imo steeti nwuchiri ụmụnwaanyị otu Ipob ruru otu narị maka ime ngagharịiwe n'Owere n'ụbọchị Fraide, izuụka gara.

Ụmụnwaanyị ndị a so na ndị ruru puku abụọ si na steeti dị iche iche n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mere ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu.

Mana akwụkwọ ozi otu Igbo Ekunie Initiative wepụtara nke onyeisi ha bụ Tochukwu Ezeoke na odeakwụkwọ ha bụ Lawrence Nwobu binyere aka, otu ahụ katọọrọ nwụchi ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nwụchiri ụmụnwaanyị ahụ ma kpọọ oku ka atọhapụ ha n'egbughi oge nakwa na-enyeghi ọnọdụ ọbụla.

Otu a katọrọ ndị uweojii maka nwụchị ụmụnwaanyị ahụ ndị ha kwuru na ha ejighi ngwa ọgụ ọbụla iwu megidere wee mee ngagharịiwe maka Nnamdi Kanu ka na-efu efu ugbua.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị Biafra n'emume ncheta ụbọchị Biafra

"Anyị nọ n'oge ọchịchị onyekwuouche ya. O kweghi nghọta na ọkpaike S.K. Durumba onye a kpụtara ụmụnwaanyị a n'ihu ya agaghị eji enye mkpebi sị ka ụmụnwaanyị ndị a lawa dịka ọ dị n'iwu. dịka o kwuru na ikpe ahụ karịrị ụlọikpe ya."

Ha gara n'ihu kwuo na 'ọ bụ ihe mgbakwuojuanya, " ngalaba gọọment na-anọ n'ụra ma ndị Fulani ọchịehi na-egbusị ọtụtụ mmadụ gara nwụchie ụmụnwaanyị Igbo ji obi udo na-eme ngagharịiwe.

Akụkọ ga-amasị gị: