Ras Kimono: Onye ga-echefu 'Under pressure' ?

Image copyright Tony Okoroji/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara taa maka ikele Ras Kimono 'naa n'ndokwa'

Emume akwamozu Augustine Oseloke Onwubuya bụ onye ama ama dịka Ras Kimono bụ otiegwu reggae nke ama ama ebidola taa.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ya nakwa ndị egwu regge na-atọ nke ọma pụtara n'ụlọọrụ 'Copyright Society of Nigeria n'Ikeja' na Legọs, n'ụtụtụ Tọọsde, ikele ya nakwa sị ya ịjeọma.

BBC Igbo gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ gbasara ihe a ga-eji cheta onye a bụ Ras Kimono.

Pretty Okafor bụ onyeisi otu ndị oti egwu akpọrọ "Performing Musicians Association of Nigeria" na Bekee gwara onye ntaakụkọ anyị na ọnwụ Ras Kimono ka na-agbawa ndị oti egwu niile bị na Naijiria na mba ofesi obi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌnwụ Ras Kimono na-eme m ka nrọ

Onye ọzọ bụ Ugochukwu Stephens ama ama dịka Rugged Man gwara BBC Igbo na egwu dị iche iche Ras Kimono tiri n'ụwa ga-adị ebiebi.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAnaghị m echezọ 'Under Pressure'

Na soshal midia, ozi di iche iche na-ekele Ras Kimono ka nkụ.

Mmadụ dịka @zachariahkelvi1 dere na twitter Ijeoma Ras Kimono.

‏Onye ọzọ bụ @kulgp4frank dere na ya na-enye ya ekele nke ịkpeazụ

Dịka ezinaụlọ ya siri kwupute n'akwụkwọ ozi ha, ha kọwara na ha ga-eli Kimono na be nna ya n'Onicha Olona dị na Delta steeti n'ụbọchị 25 n'ime ọnwa nke a.

Image copyright Tony Okoroji/ facebook
Nkenke aha onyonyo Ha ga-eji ụbọchị atọ kwanyere ya ugwu ikpeazụ

Onye bụ Ras Kimono

Ha mụrụ ras Kimono Ras n'Ekeleke Elumelu n'Onicha Olone na Delta steeti n'ụbọchị itoolu n'ịme ọnwa Mee n'afọ 1958.

Ọ gara Gbenocha Sekondari n' Agbor na Delta Steeti.

Ya na Majek Fashek banyere otu regge nke akpọrọ Jastix Reggae Ital

Egwu ya 'Under Pressure' bụ nke mbụ ya pụtara n'afọ 1989.

Ọ turu ugo dị iche iche maka egwu ya na Naịjirịa nakwa mba ofesi.

Ọ nwụrụ n'ụbọchị iri n'ime ọnwa Juun n'afọ 60.