Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ndị uweojii egbochiela mwakpo ụlọụka na Jos
Akụkọ ndị dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii awụnyela aja na garị ndị na-achọ ịgba otu ụlọụka katọlịk dị na Jos ọkụ.
Terna Tyopev na-ekwuchitere ndị uweojii na Platu steeti kọwara na ọ bụ esemokwu dị n'etiti otu ntorobia abụọ butere nke a.
O gwara ndị ntaakụkọ na okwu bidoro mgbe otu nwata nwaanyị kwuru na nwoke so n'otu ndị ọzọ metọrọ ya n'ụzọ mmekọahụ.
Ndị otu ya gara ịbọ ta ọbọ maka ihe mere onye nke ha, ọgụ esi ebe ahụ bido.
Ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Eunice Atuejide
Atuejide gbadoro ụkwụ n'otu NIP na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019.
Nwa ada Enugu steeti na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Eunice Atuejide apụtala ịkọwa ọgbaghara na-eme na pati ya bụ NIP n'ịchafụ.
Atuejide kwuru na ọ bụ ndị aghụghọ na-agbalị ịhụ na ọzụzọ ọkwa ya mara afọ n'ala site n'ibo ya ebubo mpụ na nrụrụaka ego.
Okwu na-akpọtụ
Na mba ofesi
Ndị mba Saut Afrịka akpụọla onyeisiala Amerịka Donald Trump n'ala na soshal midia maka okwu o kwuru na gọọmentị Saut Afrịka na-anara ndị ọrụụgbo ndịọcha ala ha ma na-egbu ha.
N'Egwuregwu.

Ebe foto si, Google
Aka na-achịkọta otu egwuregwu Leicester city bụ Claude Puel ekelela ọnye ọgba bọọlụ Naịjirịa Wilfred Ndidi dịka Ndịdị binyere aka n'akwụkwọ ọrụ ọhụrụ nke afọ isii n'otu egwu ahụ.
O kwuru na Ndidi bụ onye na-agba mbọ nakwa eme ihe ị tụ anya n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ.
Gee Nkeji nke mgbede a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile